< Ezekiel 27 >

1 And there is a word of Jehovah unto me, saying:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 'And thou, son of man, lift up concerning Tyre a lamentation, and thou hast said to Tyre:
“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa,
3 O dweller on the entrances of the sea, Merchant of the peoples unto many isles, Thus said the Lord Jehovah: O Tyre, thou — thou hast said: I [am] the perfection of beauty.
sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị, “Ezuru m oke nʼịma mma.”
4 In the heart of the seas [are] thy borders, Thy builders have perfected thy beauty.
I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
5 Of firs of Senir they have built to thee all thy double-boarded ships, Of cedars of Lebanon they have taken to make a mast for thee,
Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
6 Of oaks of Bashan they made thine oars, Thy bench they have made of ivory, A branch of Ashurim from isles of Chittim.
Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
7 Of fine linen with embroidery from Egypt hath been thy sail, To be to thee for an ensign, Of blue and purple from isles of Elishah hath been thy covering.
Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
8 Inhabitants of Zidon and Arvad have been rowers to thee, Thy wise men, O Tyre, have been in thee, They [are] thy pilots.
Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.
9 Elders of Gebal and its wise men have been in thee, Strengthening thy breach; All ships of the sea and their mariners, Have been in thee, to trade [with] thy merchandise.
Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
10 Persian and Lud and Phut Have been in thy forces — thy men of war. Shield and helmet they hung up in thee, They — they have given out thine honour.
“‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.
11 The sons of Arvad, and thy force, [Are] on thy walls round about, And short swordsmen in thy towers have been, Their shields they have hung up on thy walls round about, They — they have perfected thy beauty.
Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.
12 Tarshish [is] thy merchant, Because of the abundance of all wealth, For silver, iron, tin, and lead, They have given out thy remnants.
“‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
13 Javan, Tubal, and Meshech — they [are] thy merchants, For persons of men, and vessels of brass, They have given out thy merchandise.
“‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
14 They of the house of Togarmah, [For] horses, and riding steeds, and mules, They have given out thy remnants.
“‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
15 Sons of Dedan [are] thy merchants, Many isles [are] the mart of thy hand, Horns of ivory and ebony they sent back thy reward.
“‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
16 Aram [is] thy merchant, Because of the abundance of thy works, For emerald, purple, and embroidery, And fine linen, and coral, and agate, They have given out thy remnants.
“‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
17 Judah and the land of Israel — they [are] thy merchants, For wheat of Minnith, and Pannag, And honey, and oil, and balm, They have given out thy merchandise.
“‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
18 Damascus [is] thy merchant, For the abundance of thy works, Because of the abundance of all wealth, For wine of Helbon, and white wool.
“‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,
19 Vedan and Javan go about with thy remnants, They have given shining iron, cassia, and cane, In thy merchandise it hath been.
na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
20 Dedan [is] thy merchant, For clothes of freedom for riding.
“‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.
21 Arabia, and all princes of Kedar, They [are] the traders of thy hand, For lambs, and rams, and he-goats, In these thy merchants.
“‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.
22 Merchants of Sheba and Raamah — they [are] thy merchants, For the chief of all spices, And for every precious stone, and gold, They have given out thy remnants.
“‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
23 Haran, and Canneh, and Eden, merchants of Sheba, Asshur — Chilmad — [are] thy merchants,
“‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa.
24 They [are] thy merchants for perfect things, For wrappings of blue, and embroidery, And for treasuries of rich apparel, With cords bound and girded, for thy merchandise,
Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
25 Ships of Tarshish [are] thy double walls of thy merchandise, And thou art filled and honoured greatly, In the heart of the seas.
“‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri.
26 Into great waters have they brought thee, Those rowing thee, The east wind hath broken thee in the heart of the seas.
Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
27 Thy wealth and thy remnants, Thy merchandise, thy mariners, And thy pilots, strengtheners of thy breach, And the traders of thy merchandise, And all thy men of war, who [are] in thee, And in all thine assembly that [is] in thy midst, Fall into the heart of the seas in the day of thy fall,
Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.
28 At the voice of the cry of thy pilots shake do the suburbs.
Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.
29 And come down from their ships have all handling an oar, Mariners, all the pilots of the sea, on the land they stand,
Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri, na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri, ga-esitekwa nʼụgbọ ha rịdata guzo nʼelu ala.
30 And have sounded for thee with their voice, And cry bitterly, and cause dust to go up on their heads, In ashes they do roll themselves.
Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.
31 And they have made for thee baldness, And they have girded on sackcloth, And they have wept for thee, In bitterness of soul — a bitter mourning.
Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
32 And lifted up for thee have their sons a lamentation, And they have lamented over thee, who [is] as Tyre? As the cut-off one in the midst of the sea?
Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”
33 With the outgoing of thy remnants from the seas, Thou hast filled many peoples, With the abundance of thy riches, and thy merchandise, Thou hast made rich things of earth.
Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
34 The time of [thy] being broken by the seas in the depths of the waters, Thy merchandise and all thy assembly in thy midst have fallen.
Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
35 All inhabitants of the isles have been astonished at thee, And their kings have been sore afraid, They have been troubled in countenance.
Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.
36 Merchants among the peoples have shrieked for thee, Wastes thou hast been, and thou art not — to the age!'
Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha, nʼihi na ihe mere gị dị egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’”

< Ezekiel 27 >