< Esther 4 >
1 And Mordecai hath known all that hath been done, and Mordecai rendeth his garments, and putteth on sackcloth and ashes, and goeth forth into the midst of the city and crieth — a cry loud and bitter,
Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa.
2 and he cometh in unto the front of the gate of the king, but none is to come in unto the gate of the king with a sackcloth-garment.
Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze.
3 And in every province and province, the place where the word of the king, even his law, is coming, a great mourning have the Jews, and fasting, and weeping, and lamenting: sackcloth and ashes are spread for many.
Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.
4 And young women of Esther come in and her eunuchs, and declare [it] to her, and the queen is exceedingly pained, and sendeth garments to clothe Mordecai, and to turn aside his sackcloth from off him, and he hath not received [them].
Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha.
5 And Esther calleth to Hatach, of the eunuchs of the king, whom he hath stationed before her, and giveth him a charge for Mordecai, to know what this [is], and wherefore this [is].
Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.
6 And Hatach goeth out unto Mordecai, unto a broad place of the city, that [is] before the gate of the king,
Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.
7 and Mordecai declareth to him all that hath met him, and the explanation of the money that Haman said to weigh to the treasuries of the king for the Jews, to destroy them,
Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.
8 and the copy of the writing of the law that had been given in Shushan to destroy them he hath given to him, to shew Esther, and to declare [it] to her, and to lay a charge on her to go in unto the king, to make supplication to him, and to seek from before him, for her people.
O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.
9 And Hatach cometh in and declareth to Esther the words of Mordecai,
Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.
10 and Esther speaketh to Hatach, and chargeth him for Mordecai:
Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị,
11 'All servants of the king, and people of the provinces of the king, do know that any man and woman, who cometh in unto the king, unto the inner court, who is not called — one law [of] his [is] to put [them] to death, apart from him to whom the king holdeth out the golden sceptre, then he hath lived; and I — I have not been called to come in unto the king these thirty days.'
“Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.”
12 And they declare to Mordecai the words of Esther,
Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara,
13 and Mordecai speaketh to send back unto Esther: 'Do not think in thy soul to be delivered [in] the house of the king, more than all the Jews,
o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile.
14 but if thou keep entirely silent at this time, respite and deliverance remaineth to the Jews from another place, and thou and the house of thy fathers are destroyed; and who knoweth whether for a time like this thou hast come to the kingdom?'
Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?”
15 And Esther speaketh to send back unto Mordecai:
Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị;
16 'Go, gather all the Jews who are found in Shushan, and fast for me, and do not eat nor drink three days, by night and by day; also I and my young women do fast likewise, and so I go in unto the king, that [is] not according to law, and when I have perished — I have perished.'
“Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
17 And Mordecai passeth on, and doth according to all that Esther hath charged upon him.
Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.