< 1 Samuel 16 >

1 And Jehovah saith unto Samuel, 'Till when art thou mourning for Saul, and I have rejected him from reigning over Israel? fill thy horn with oil, and go, I send thee unto Jesse the Beth-Lehemite, for I have seen among his sons for Myself a king.
Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”
2 And Samuel saith, 'How do I go? when Saul hath heard, then he hath slain me.' And Jehovah saith, 'A heifer of the herd thou dost take in thy hand, and hast said, To sacrifice to Jehovah I have come;
Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’
3 and thou hast called for Jesse in the sacrifice, and I cause thee to know that which thou dost do, and thou hast anointed to Me him of whom I speak unto thee.'
Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”
4 And Samuel doth that which Jehovah hath spoken, and cometh in to Beth-Lehem, and the elders of the city tremble to meet him, and [one] saith, 'Is thy coming peace?'
Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”
5 and he saith, 'Peace; to sacrifice to Jehovah I have come, sanctify yourselves, and ye have come in with me to the sacrifice;' and he sanctifieth Jesse and his sons, and calleth them to the sacrifice.
Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.
6 And it cometh to pass, in their coming in, that he seeth Eliab, and saith, 'Surely, before Jehovah [is] His anointed.'
Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
7 And Jehovah saith unto Samuel, 'Look not unto his appearance, and unto the height of his stature, for I have rejected him; for [it is] not as man seeth — for man looketh at the eyes, and Jehovah looketh at the heart.'
Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
8 And Jesse calleth unto Abinadab, and causeth him to pass by before Samuel; and he saith, 'Also on this Jehovah hath not fixed.'
Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
9 And Jesse causeth Shammah to pass by, and he saith, 'Also on this Jehovah hath not fixed.'
Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
10 And Jesse causeth seven of his sons to pass by before Samuel, and Samuel saith to Jesse, 'Jehovah hath not fixed on these.'
Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”
11 And Samuel saith unto Jesse, 'Are the young men finished?' and he saith, 'Yet hath been left the youngest; and lo, he delighteth himself among the flock;' and Samuel saith unto Jesse, 'Send and take him, for we do not turn round till his coming in hither.'
Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”
12 And he sendeth, and bringeth him in, and he [is] ruddy, with beauty of eyes, and of good appearance; and Jehovah saith, 'Rise, anoint him, for this [is] he.'
Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”
13 And Samuel taketh the horn of oil, and anointeth him in the midst of his brethren, and prosper over David doth the Spirit of Jehovah from that day and onwards; and Samuel riseth and goeth to Ramath.
Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema.
14 And the Spirit of Jehovah turned aside from Saul, and a spirit of sadness from Jehovah terrified him;
Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl.
15 and the servants of Saul say unto him, 'Lo, we pray thee, a spirit of sadness [from] God is terrifying thee;
Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.
16 let our lord command, we pray thee, thy servants before thee, they seek a skilful man, playing on a harp, and it hath come to pass, in the spirit of sadness [from] God being upon thee, that he hath played with his hand, and [it is] well with thee.'
Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”
17 And Saul saith unto his servants, 'Provide, I pray you, for me a man playing well — then ye have brought [him] in unto me.'
Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”
18 And one of the servants answereth and saith, 'Lo, I have seen a son of Jesse the Beth-Lehemite, skilful in playing, and a mighty virtuous man, and a man of battle, and intelligent in word, and a man of form, and Jehovah [is] with him.'
Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”
19 And Saul sendeth messengers unto Jesse, and saith, 'Send unto me David thy son, who [is] with the flock.'
Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”
20 And Jesse taketh an ass, [with] bread, and a bottle of wine, and one kid of the goats, and sendeth by the hand of David his son unto Saul.
Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
21 And David cometh in unto Saul, and standeth before him, and he loveth him greatly; and he is a bearer of his weapons.
Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.
22 And Saul sendeth unto Jesse, saying, 'Let David, I pray thee, stand before me, for he hath found grace in mine eyes.'
Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”
23 And it hath come to pass, in the spirit of [sadness from] God being on Saul, that David hath taken the harp, and played with his hand, and Saul hath refreshment and gladness, and the spirit of sadness hath turned aside from off him.
Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.

< 1 Samuel 16 >