< Exodus 34 >

1 And aftirward God seide, Hewe to thee twey tablis of stoon at the licnesse of the formere, and Y schal write on tho tablis thilke wordis, whiche the tablis, that thou `hast broke, hadden.
Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị.
2 Be thou redi in the morewtid, that thou stie anoon in to the hil of Synai; and thou schalt stonde with me on the cop of the hil;
Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.
3 no man stie with thee, nether ony man be seyn bi al the hil, and oxun and scheep be not fed ayens `the hil.
Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”
4 Therfor Moises hewide twey tablis of stoon, whiche manere tablis weren bifore, and he roos bi nyyt, and stiede in to the hil of Synay, as the Lord comaundide to hym; and he bar with hym the tablis.
Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya.
5 And whanne the Lord hadde come doun bi a cloude, Moises stood with hym, and clepide inwardli `the name of the Lord;
Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.
6 and whanne the Lord passide bifore hym, he seide, Lordschipere, Lord God, mercyful, and pitouse, pacient, and of myche mersiful doyng, and sothefast,
O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
7 which kepist couenaunt and mercy in to `a thousande, which doist awey wickidnesse, and trespassis, and synnes, and noon bi hym silf is innocent anentis thee, which yeldist the wickidnesse of fadris to sones and to sones of sones, into the thridde and fourthe generacioun.
Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”
8 And hastili Moises was bowid low `in to erthe, and worschipide,
Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,
9 and seide, Lord, if Y haue founde grace in thi siyt, Y biseche that thou go with vs, for the puple is of hard nol, and that thou do awey oure wickidnesses and synnes, and welde vs.
sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”
10 The Lord answeride, Y schal make couenaunt, and in siyt of alle men Y schal make signes, that weren neuer seyn on erthe, nether in ony folkis, that this puple, in whos myddis thou art, se the ferdful werk of the Lord, which Y schal make.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.
11 Kepe thou alle thingis, whiche Y comaundide to thee to dai; I my silf schal caste out bifor thi face Amorrey, and Cananey, and Ethei, and Ferezei, and Euey, and Jebusei.
Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.
12 Be war, lest ony tyme thou ioyne frendschipis with the dwelleris of that lond, whiche frenschipis be in to fallyng to thee.
Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu.
13 But also distrie thou `the auteris of hem, breke the ymagis, and kitte doun the woodis;
Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha.
14 `nyl thou worschipe an alien God; `the Lord a gelous louyere is his name, God is a feruent louyere;
Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
15 make thou not couenaunt with the men of tho cuntreis, lest whanne thei han do fornycacioun with her goddis, and han worschipid the symylacris of hem, ony man clepe thee, that thou ete of thingis offrid to an ydol.
“Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha.
16 Nether thou schalt take a wyif of her douytris to thi sones, lest aftir that tho douytris han do fornycacioun, thei make also thi sones to do fornicacioun in to her goddis.
Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a.
17 Thou schalt not make to thee yotun goddis.
“Unu akpụla chi ọbụla.
18 Thou schalt kepe the solempynyte of therf looues; seuene daies thou schalt ete therf looues, as Y comaundide to thee, in the time of the monethe of newe fruytis; for in the monethe of veer tyme thou yedist out of Egipt.
“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
19 Al thing of male kynde that openeth the wombe schal be myn, of alle lyuynge beestis, as wel of oxun, as of scheep, it schal be myn.
“Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu.
20 Thou schalt ayenbie with a scheep the firste gendrid of an asse, ellis if thou yyuest not prijs therfor, it schal be slayn. Thou schalt ayenbie the firste gendrid of thi sones; nether thou schalt appere voide in my siyt.
E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.
21 Sixe daies thou schalt worche, the seuenthe day thou schalt ceesse to ere and repe.
“Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.
22 Thou schalt make to thee the solempnyte of woukis in the firste thingis of fruytis of thi ripe corn of wheete, and the solempnyte, whanne alle thingis ben gadrid in to bernes, whanne the tyme `of yeer cometh ayen.
“Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.
23 Ech male kynde of thee schal appere in thre tymes of the yeer in the siyt of the Lord Almyyti, thi God of Israel.
Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel.
24 For whanne Y schal take awei folkis fro thi face, and Y schal alarge thi termes, noon schal sette tresouns to thi lond, while thou stiest and apperist in the siyt of thi Lord God, thries in the yeer.
Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ.
25 Thou schalt not offre on sour dow the blood of my sacrifice, nethir ony thing of the slayn sacrifice of the solempnyte of fase schal abide in the morewtid.
“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ.
26 Thou schalt offre in the hows of thi Lord God the firste of the fruytis of thi lond. Thou schalt not sethe a kide in the mylk of his modir.
“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma nʼụlọ Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.”
27 And the Lord seide to Moises, Write thou these wordis, bi whiche Y smoot a boond of pees, bothe with thee and with Israel.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Dee iwu ndị a m nyere gị, nʼihi na dịka okwu ndị a si dị, ka ọgbụgba ndụ mụ na gị na ụmụ Izrel gbara si dị.”
28 Therfor Moises was there with the Lord bi fourti daies and bi fourti nyytis, he eet not breed, and drank not watir; and he wroot in tablys ten wordis of the boond of pees.
Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
29 And whanne Moises cam doun fro the hil of Synai, he helde twei tablis of witnessyng, and he wiste not that his face was horned of the felouschipe of Goddis word.
Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.
30 Forsothe Aaron and the sones of Israel sien Moises face horned,
Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.
31 and thei dredden to neiye niy, and thei weren clepid of hym, `and thei turneden ayen, as wel Aaron as the princis of the synagoge; and after that Moises spak, thei camen to hym,
Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.
32 yhe alle the sones of Israel; to whiche Moises comaundide alle thingis, whiche he hadde herd of the Lord in the hil of Synai.
Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.
33 And whanne the wordis weren fillid, he puttide a veil on his face;
Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.
34 and he entride to the Lord, and spak with hym, and dide awey that veil, til he yede out; and thanne he spak to the sones of Israel alle thingis, that weren comaundid to hym;
Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
35 whiche sien that the face of Moyses goynge out was horned, but eft he hilide his face, if ony tyme he spak to hem.
Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.

< Exodus 34 >