< Colossians 1 >

1 Paul, an Apostle of Christ Jesus by the will of God--and Timothy our brother:
Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,
2 To the people of God and the believing brethren at Colossae who are in Christ. May grace and peace be granted to you from God our Father.
Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu.
3 We give thanks to God, the Father of our Lord Jesus Christ, constantly praying for you as we do,
Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.
4 because we have heard of your faith in Christ Jesus and of the love which you cherish towards all God's people,
Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya.
5 on account of the hope treasured up for you in Heaven. Of this hope you have already heard in the Message of the truth of the Good News.
Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma,
6 For it has reached you, and remains with you, just as it has also spread through the whole world, yielding fruit there and increasing, as it has done among you from the day when first you heard it and came really to know the grace of God,
nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.
7 as you learned it from Epaphras our dearly-loved fellow servant. He is to you a faithful minister of Christ in our stead,
Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu.
8 and moreover he has informed us of your love, which is inspired by the Spirit.
O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ.
9 For this reason we also, from the day we first received these tidings, have never ceased to pray for you and to entreat that you may be filled with a clear knowledge of His will accompanied by thorough wisdom and discernment in spiritual things;
Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile.
10 so that your lives may be worthy of the Lord and perfectly pleasing to Him, while you exhibit the results of right action of every sort and grow into a fuller knowledge of God.
Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile.
11 Since His power is so glorious, may you be strengthened with strength of every kind, and be prepared for cheerfully enduring all things with patience and long-suffering;
Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
12 and give thanks to the Father who has made us fit to receive our share of the inheritance of God's people in Light.
na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè.
13 It is God who has delivered us out of the dominion of darkness, and has transferred us into the Kingdom of His dearly-loved Son,
Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya.
14 in whom we have our redemption--the forgiveness of our sins.
Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.
15 Christ is the visible representation of the invisible God, the Firstborn and Lord of all creation.
Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke.
16 For in Him was created the universe of things in heaven and on earth, things seen and things unseen, thrones, dominions, princedoms, powers--all were created, and exist through and for Him.
Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya.
17 And HE IS before all things and in and through Him the universe is a harmonious whole.
Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
18 Moreover He is the Head of His Body, the Church. He is the Beginning, the Firstborn from among the dead, in order that He Himself may in all things occupy the foremost place.
Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile.
19 For it was the Father's gracious will that the whole of the divine perfections should dwell in Him.
Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi.
20 And God purposed through Him to reconcile the universe to Himself, making peace through His blood, which was shed upon the Cross--to reconcile to Himself through Him, I say, things on earth and things in Heaven.
Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.
21 And you, estranged as you once were and even hostile in your minds, amidst your evil deeds,
Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu.
22 He has now, in His human body, reconciled to God by His death, to bring you, holy and faultless and irreproachable, into His presence;
Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha.
23 if, indeed, you are still firmly holding to faith as your foundation, without ever shifting from your hope that rests on the Good News that you have heard, which has been proclaimed in the whole creation under Heaven, and in which I Paul have been appointed to serve.
Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
24 Now I can find joy amid my sufferings for you, and I fill up in my own person whatever is lacking in Christ's afflictions on behalf of His Body, the Church.
Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị.
25 I have been appointed to serve the Church in the position of responsibility entrusted to me by God for your benefit, so that I may fully deliver God's Message--
Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya.
26 the truth which has been kept secret from all ages and generations, but has now been revealed to His people, (aiōn g165)
Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. (aiōn g165)
27 to whom it was His will to make known how vast a wealth of glory for the Gentile world is implied in this truth--the truth that 'Christ is in you, the hope of glory.'
Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ.
28 Him we preach, admonishing every one and instructing every one, with all possible wisdom, so that we may bring every one into God's presence, made perfect through Christ.
Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst.
29 To this end, like an earnest wrestler, I exert all my strength in reliance upon the power of Him who is mightily at work within me.
Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.

< Colossians 1 >