< Acts 21 >

1 When, at last, we had torn ourselves away and had set sail, we ran in a straight course to Cos; the next day to Rhodes, and from there to Patara.
Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara.
2 Finding a ship bound for Phoenicia, we went on board and put to sea.
Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.
3 After sighting Cyprus and leaving that island on our left, we continued our voyage to Syria and put in at Tyre; for there the ship was to unload her cargo.
Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
4 Having searched for the disciples and found them, we stayed at Tyre for seven days; and, taught by the Spirit, they repeatedly urged Paul not to proceed to Jerusalem.
Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.
5 When, however, our time was up, we left and went on our way, all the disciples and their wives and children coming to see us off. Then, after kneeling down on the beach and praying,
Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.
6 we took leave of one another; and we went on board, while they returned home.
Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.
7 As for us, our voyage was over when having sailed from Tyre we reached Ptolemais. here we inquired after the welfare of the brethren, and remained a day with them.
Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.
8 On the morrow we left Ptolemais and went on to Caesarea, where we came to the house of Philip the Evangelist, who was one of the seven, and stayed with him.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.
9 Now Philip had four unmarried daughters who were prophetesses;
O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
10 and during our somewhat lengthy stay a Prophet of the name of Agabus came down from Judaea.
Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata.
11 When he arrived he took Paul's loincloth, and bound his own feet and arms with it, and said, "Thus says the Holy Spirit, 'So will the Jews in Jerusalem bind the owner of this loincloth, and will hand him over to the Gentiles.'"
Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’”
12 As soon as we heard these words, both we and the brethren at Caesarea entreated Paul not to go up to Jerusalem.
Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.
13 His reply was, "What can you mean by thus breaking my heart with your grief? Why, as for me, I am ready not only to go to Jerusalem and be put in chains, but even to die there for the sake of the Lord Jesus."
Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”
14 So when he was not to be dissuaded, we ceased remonstrating with him and said, "The Lord's will be done!"
Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
15 A few days afterwards we loaded our baggage-cattle and continued our journey to Jerusalem.
Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem.
16 Some of the disciples from Caesarea also joined our party, and brought with them Mnason, a Cyprian, one of the early disciples, at whose house we were to lodge.
Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.
17 At length we reached Jerusalem, and there the brethren gave us a hearty welcome.
Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị.
18 On the following day we went with Paul to call on James, and all the Elders of the Church came also.
Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.
19 After exchanging friendly greetings, Paul told in detail all that God had done among the Gentiles through his instrumentality.
Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya.
20 And they, when they had heard his statement, gave the glory to God. Then they said, "You see, brother, how many tens of thousands of Jews there are among those who have accepted the faith, and they are all zealous upholders of the Law.
Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.
21 Now what they have been repeatedly told about you is that you teach all the Jews among the Gentiles to abandon Moses, and that you forbid them to circumcise their children or observe old-established customs.
A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.
22 What then ought you to do? They are sure to hear that you have come to Jerusalem;
Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.
23 so do this which we now tell you. We have four men here who have a vow resting on them.
Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.
24 Associate with these men and purify yourself with them, and pay their expenses so that they can shave their heads. Then everybody will know that there is no truth in these stories about you, but that in your own actions you yourself scrupulously obey the Law.
Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.
25 But as for the Gentiles who have accepted the faith, we have communicated to them our decision that they are carefully to abstain from anything sacrificed to an idol, from blood, from what is strangled, and from fornication."
Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
26 So Paul associated with the men; and the next day, having purified himself with them, he went into the Temple, giving every one to understand that the days of their purification were finished, and there he remained until the sacrifice for each of them was offered.
Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ.
27 But, when the seven days were nearly over, the Jews from the province of Asia, having seen Paul in the Temple, set about rousing the fury of all the people against him.
Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,
28 They laid hands on him, crying out, "Men of Israel, help! help! This is the man who goes everywhere preaching to everybody against the Jewish people and the Law and this place. And besides, he has even brought Gentiles into the Temple and has desecrated this holy place."
na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”
29 (For they had previously seen Trophimus the Ephesian with him in the city, and imagined that Paul had brought him into the Temple.)
(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)
30 The excitement spread through the whole city, and the people rushed in crowds to the Temple, and there laid hold of Paul and began to drag him out; and the Temple gates were immediately closed.
Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
31 But while they were trying to kill Paul, word was taken up to the Tribune in command of the battalion, that all Jerusalem was in a ferment.
Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
32 He instantly sent for a few soldiers and their officers, and came down among the people with all speed. At the sight of the Tribune and the troops they ceased beating Paul.
Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
33 Then the Tribune, making his way to him, arrested him, and, having ordered him to be secured with two chains, proceeded to ask who he was and what he had been doing.
Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
34 Some of the crowd shouted one accusation against Paul and some another, until, as the uproar made it impossible for the truth to be ascertained with certainty, the Tribune ordered him to be brought into the barracks.
Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.
35 When Paul was going up the steps, he had to be carried by the soldiers because of the violence of the mob;
Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu.
36 for the whole mass of the people pressed on in the rear, shouting, "Away with him!"
Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”
37 When he was about to be taken into the barracks, Paul said to the Tribune, "May I speak to you?" "Do you know Greek?" the Tribune asked.
Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
38 "Are you not the Egyptian who some years ago excited the riot of the 4,000 cut-throats, and led them out into the Desert?"
Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”
39 "I am a Jew," replied Paul, "belonging to Tarsus in Cilicia, and am a citizen of no unimportant city. Give me leave, I pray you, to speak to the people."
Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
40 So with his permission Paul stood on the steps and motioned with his hand to the people to be quiet; and when there was perfect silence he addressed them in Hebrew.
Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,

< Acts 21 >