< Genesis 40 >

1 And it came to pass after these things, [that] the butler of the king of Egypt and [his] baker had offended their lord the king of Egypt.
Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.
2 And Pharaoh was wroth with two [of] his officers, with the chief of the butlers, and with the chief of the bakers.
Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
3 And he put them in custody in the house of the captain of the guard, into the prison, the place where Joseph [was] bound.
O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
4 And the captain of the guard charged Joseph with them, and he served them; and they continued a season in custody.
Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
5 And they dreamed a dream both of them, each man his dream in one night, each man according to the interpretation of his dream; the butler and the baker of the king of Egypt, who [were] bound in the prison.
Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
6 And Joseph came to them in the morning, and looked upon them, and behold, they [were] sad.
Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.
7 And he asked Pharaoh's officers that [were] with him in the ward of his lord's house, saying, Why look ye [so] sad to-day?
Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”
8 And they said to him, We have dreamed a dream, and [there is] no interpreter of it. And Joseph said to them, [Do] not interpretations [belong] to God? tell me [them], I pray you.
Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”
9 And the chief butler told his dream to Joseph, and said to him, In my dream, behold, a vine [was] before me;
Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.
10 And on the vine [were] three branches: and it [was] as though it budded, [and] its blossoms shot forth; and its clusters brought forth ripe grapes:
Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa.
11 And Pharaoh's cup [was] in my hand: and I took the grapes, and pressed them into Pharaoh's cup, and I gave the cup into Pharaoh's hand.
Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.”
12 And Joseph said to him, This [is] the interpretation of it: The three branches [are] three days;
Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ.
13 Yet within three days shall Pharaoh lift up thy head, and restore thee to thy place: and thou shalt deliver Pharaoh's cup into his hand, after the former manner when thou wast his butler.
Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya.
14 But think on me when it shall be well with thee, and show kindness to me, I pray thee, and make mention of me to Pharaoh, and bring me out of this house:
Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.
15 For indeed I was stolen away from the land of the Hebrews: and here also have I done nothing that they should put me into the dungeon.
Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
16 When the chief baker saw that the interpretation was good, he said to Joseph, I also [was] in my dream, and behold, [I had] three white baskets on my head:
Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
17 And in the uppermost basket [there was] of all manner of bake-meats for Pharaoh; and the birds ate them out of the basket upon my head.
Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
18 And Joseph answered, and said, This [is] the interpretation of it: The three baskets [are] three days:
Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ.
19 Yet within three days shall Pharaoh lift up thy head from off thee, and shall hang thee on a tree; and the birds shall eat thy flesh from off thee.
Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”
20 And it came to pass the third day, [which was] Pharaoh's birth-day, that he made a feast to all his servants: and he lifted up the head of the chief butler and of the chief baker among his servants.
Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
21 And he restored the chief butler to his butlership again; and he gave the cup into Pharaoh's hand:
O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ.
22 But he hanged the chief baker: as Joseph had interpreted to them.
Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
23 Yet the chief butler did not remember Joseph, but forgot him.
Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.

< Genesis 40 >