< 2 Kings 6 >

1 And the sons of the prophets said to Elisha, Behold now, the place where we dwell with thee is too narrow for us.
Ụmụ ndị amụma gwara Ịlaisha okwu sị, “Lee, ebe a anyị bi nʼihu gị dị oke nta karịa.
2 Let us go, we pray thee, to Jordan, and take thence every man a beam, and let us make us a place there, where we may dwell. And he answered, Go ye.
Ya mere, ka anyị gaa nʼakụkụ Jọdan gbute osisi anyị ga-eji wuo ụlọ ebe anyị ga-ebi.” Ọ sịrị ha, “Meenụ ka unu kwuru.”
3 And one said, Be content, I pray thee, and go with thy servants. And he answered, I will go.
Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, “Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị.” O kwenyere na ọ ga-eso ha.
4 So he went with them. And when they came to Jordan, they cut down wood.
O sonyekwara ha. Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi.
5 But as one was felling a beam, the ax head fell into the water: and he cried, and said, Alas, master! for it was borrowed.
Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.”
6 And the man of God said, Where fell it? And he showed him the place. And he cut down a stick, and cast [it] in thither; and the iron floated.
Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri.
7 Therefore said he, Take [it] up to thee. And he put out his hand, and took it.
Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.
8 Then the king of Syria warred against Israel, and took counsel with his servants, saying, In such and such a place [shall be] my camp.
Nʼoge a, eze ndị Aram na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.”
9 And the man of God sent to the king of Israel, saying, Beware that thou pass not such a place; for thither the Syrians have come down.
Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.”
10 And the king of Israel sent to the place which the man of God told him and warned him of, and saved himself there, not once nor twice.
Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile.
11 Therefore the heart of the king of Syria was greatly troubled for this thing; and he called his servants, and said to them, Will ye not show me which of us [is] for the king of Israel?
Ihe ndị a mere ka iwe wee eze ndị Aram. Ọ kpọkọtara ndịisi ọrụ ya nye ha iwu sị, “Gwanụ m, onye nʼime anyị dịnyere eze Izrel?”
12 And one of his servants said, None, my lord, O king: but Elisha, the prophet that [is] in Israel, telleth the king of Israel the words that thou speakest in thy bed-chamber.
Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.”
13 And he said, Go, and spy where he [is], that I may send and bring him. And it was told him, saying, Behold, [he is] in Dothan.
Ya mere, eze Aram nyere ha iwu sị ha, “Gaanụ, chọpụta ebe ọ nọ, ka m ziga ndị agha ga-aga jide ya.” Ha gara lọta, kọọrọ ya na Ịlaisha nọ na Dọtan.
14 Therefore he sent thither horses, and chariots, and a great host: and they came by night, and encompassed the city.
Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu.
15 And when the servant of the man of God had risen early, and gone forth, behold, a host compassed the city both with horses and chariots. And his servant said to him, Alas, my master! how shall we do?
Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?”
16 And he answered, Fear not: for they that [are] with us [are] more than they that [are] with them.
Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.”
17 And Elisha prayed, and said, LORD, I pray thee, open his eyes, that he may see. And the LORD opened the eyes of the young man; and he saw: and behold, the mountain [was] full of horses and chariots of fire around Elisha.
Mgbe ahụ, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, biko, saghee anya ya abụọ ka ọ hụ.” Onyenwe anyị meghere anya ohu Ịlaisha, mee ka ọ hụ ịnyịnya ọkụ, na ụgbọala ọkụ jupụtara nʼugwu dị gburugburu ebe ahụ niile.
18 And when they came down to him, Elisha prayed to the LORD, and said, Smite this people, I pray thee, with blindness. And he smote them with blindness according to the word of Elisha.
Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ.
19 And Elisha said to them, This [is] not the way, neither [is] this the city: follow me, and I will bring you to the man whom ye seek. But he led them to Samaria.
Ịlaisha pụtara sị ha, “Nke a abụghị ụzọ, nke a abụkwaghị obodo unu na-achọ. Soronụ m, ka m gosi unu nwoke unu na-achọ.” O duuru ha jee Sameria.
20 And it came to pass, when they had come into Samaria, that Elisha said, LORD, open the eyes of these [men], that they may see. And the LORD opened their eyes, and they saw; and behold, [they were] in the midst of Samaria.
Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, Onyenwe anyị, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” Onyenwe anyị meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.
21 And the king of Israel said to Elisha, when he saw them, My father, shall I smite [them]? shall I smite [them]?
Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Nna m, ị chọrọ ka m gbuo ha?”
22 And he answered, Thou shalt not smite [them]: wouldst thou smite those whom thou hast taken captive with thy sword and with thy bow? set bread and water before them, that they may eat and drink, and go to their master.
Ịlaisha zara sị ya, “Egbula ha. Ị ga-egbu ndị i ji mma agha na ụta gị dọta nʼagha? Nye ha nri na mmiri, zilaga ha ka ha lakwuru onyenwe ha.”
23 And he prepared great provision for them: and when they had eaten and drank, he sent them away, and they went to their master. So the bands of Syria came no more into the land of Israel.
Ya mere, ọ kwadooro ha oke oriri dị ukwuu, mgbe ha riri, ṅụkwaa, o zilagara ha, ha lakwuuru nna ha ukwu. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ndị otu Aram na-apụnara mmadụ ihe kwusịrị inye nsogbu nʼoke ala ndị Izrel.
24 And it came to pass after this, that Ben-hadad king of Syria gathered all his army, and went up, and besieged Samaria.
Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu.
25 And there was a great famine in Samaria: and behold, they besieged it, until an ass's head was [sold] for eighty [pieces] of silver, and the fourth part of a cab of dove's dung for five [pieces] of silver.
Nʼihi nke a, oke ụnwụ dara nʼobodo Sameria. Nri kọrọ nʼala ahụ ruo na e bidoro ire otu isi ịnyịnya ibu iri shekel ọlaọcha asatọ. E rekwara nsị nduru shekel ise.
26 And as the king of Israel was passing by upon the wall, there cried a woman to him, saying, Help, my lord, O king.
Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.”
27 And he said, If the LORD doth not help thee, whence shall I help thee? out of the barn-floor, or out of the wine-press?
Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?”
28 And the king said to her, What aileth thee? and she answered, This woman said to me, Give thy son, that we may eat him to-day, and we will eat my son to-morrow.
Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’
29 So we boiled my son, and ate him: and I said to her on the next day, Give thy son, that we may eat him: and she hath hid her son.
Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.”
30 And it came to pass, when the king heard the words of the woman, that he rent his clothes; and he passed by upon the wall, and the people looked, and behold, [he had] sackcloth within upon his flesh.
Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya.
31 Then he said, God do so and more also to me, if the head of Elisha the son of Shaphat shall stand on him this day.
Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”
32 But Elisha sat in his house, and the elders sat with him; and [the king] sent a man from before him: but ere the messenger came to him, he said to the elders, See ye how this son of a murderer hath sent to take away my head? look, when the messenger cometh, shut the door, and hold him fast at the door: [is] not the sound of his master's feet behind him?
Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.”
33 And while he yet talked with them, behold, the messenger came down to him: and he said, Behold, this evil [is] from the LORD; what should I wait for the LORD any longer?
Mgbe Ịlaisha nọ na-agwa ha okwu, lee onyeozi ahụ ka ọ na-abịakwute ya. Eze sokwa ya nʼazụ na-ekwu okwu na-asị, “Onyenwe anyị emeela ka ihe ọjọọ dị otu a dakwasị anyị. Gịnị mere m ga-eji lee anya inyeaka site nʼaka Onyenwe anyị ọzọ?”

< 2 Kings 6 >