< Numbers 28 >

1 And the LORD spoke to Moses, saying,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 Command the children of Israel, and say to them, My offering, and my bread for my sacrifices made by fire, for a sweet savour to me, shall ye observe to offer to me in their due season.
“Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’
3 And thou shalt say to them, This is the offering made by fire which ye shall offer to the LORD; two lambs of the first year without spot day by day, for a continual burnt offering.
Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
4 The one lamb shalt thou offer in the morning, and the other lamb shalt thou offer at evening;
Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
5 And a tenth part of an ephah of flour for a meat offering, mixed with a fourth part of an hin of beaten oil.
Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
6 It is a continual burnt offering, which was ordained in mount Sinai for a sweet savour, a sacrifice made by fire to the LORD.
Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.
7 And its drink offering shall be the fourth part of an hin for the one lamb: in the holy place shalt thou cause the strong wine to be poured to the LORD for a drink offering.
Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.
8 And the other lamb shalt thou offer at evening: as the meat offering of the morning, and as its drink offering, thou shalt offer it, a sacrifice made by fire, of a sweet savour to the LORD.
Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
9 And on the sabbath day two lambs of the first year without spot, and two tenth parts of flour for a meat offering, mixed with oil, and its drink offering:
“‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
10 This is the burnt offering of every sabbath, besides the continual burnt offering, and its drink offering.
Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
11 And in the beginnings of your months ye shall offer a burnt offering to the LORD; two young bulls, and one ram, seven lambs of the first year without spot;
“‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
12 And three tenth parts of flour for a meat offering, mixed with oil, for one bull; and two tenth parts of flour for a meat offering, mixed with oil, for one ram;
Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
13 And a tenth part of flour mixed with oil for a meat offering to one lamb; for a burnt offering of a sweet savour, a sacrifice made by fire to the LORD.
Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
14 And their drink offerings shall be half an hin of wine to a bull, and the third part of an hin to a ram, and a fourth part of an hin to a lamb: this is the burnt offering of every month throughout the months of the year.
Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
15 And one kid of the goats for a sin offering to the LORD shall be offered, besides the continual burnt offering, and its drink offering.
nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.
16 And on the fourteenth day of the first month is the passover of the LORD.
“‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị.
17 And on the fifteenth day of this month is the feast: seven days shall unleavened bread be eaten.
Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
18 On the first day shall be an holy convocation; in it ye shall do no manner of servile work:
Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.
19 But ye shall offer a sacrifice made by fire for a burnt offering to the LORD; two young bulls, and one ram, and seven lambs of the first year: they shall be to you without blemish:
Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
20 And their meat offering shall be of flour mixed with oil: three tenth parts shall ye offer for a bull, and two tenth parts for a ram;
Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.
21 A tenth part shalt thou offer for every lamb, throughout the seven lambs:
Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma.
22 And one goat for a sin offering, to make an atonement for you.
Tinye otu mkpi nʼihi ịchụ aja mmehie maka ikpuchiri unu mmehie unu.
23 Ye shall offer these besides the burnt offering in the morning, which is for a continual burnt offering.
A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile.
24 After this manner ye shall offer daily, throughout the seven days, the food of the sacrifice made by fire, of a sweet savour to the LORD: it shall be offered besides the continual burnt offering, and its drink offering.
A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị.
25 And on the seventh day ye shall have an holy convocation; ye shall do no servile work.
Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
26 Also in the day of the firstfruits, when ye bring a new meat offering to the LORD, after your weeks are ended, ye shall have an holy convocation; ye shall do no servile work:
“‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
27 But ye shall offer the burnt offering for a sweet savour to the LORD; two young bulls, one ram, seven lambs of the first year;
Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a.
28 And their meat offering of flour mixed with oil, three tenth parts to one bull, two tenth parts to one ram,
Ihe unu ga-etinye nʼihe ndị a bụ aja mkpụrụ ọka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi otu oke ehi. Lita ụtụ ọka anọ na ọkara, nʼisi otu ebule,
29 A tenth part to one lamb, throughout the seven lambs;
na lita ụtụ ọka abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
30 And one kid of the goats, to make an atonement for you.
Ọzọkwa, a ga-eji otu mkpi chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
31 Ye shall offer them besides the continual burnt offering, and its meat offering, (they shall be to you without blemish ) and their drink offerings.
Dozie aja ndị a tinyere aja ihe ọṅụṅụ ha, ya na aja nsure ọkụ na aja mkpụrụ ọka ya na aja ahụ so. Hụkwanụ na anụ ụlọ e ji chụọ aja ndị a bụ ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla.

< Numbers 28 >