< Psalms 112 >

1 Praise Yahweh. Blessed is the man who obeys Yahweh, who greatly delights in his commandments.
Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
2 His descendants will be powerful on earth; the descendants of the godly man will be blessed.
Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
3 Wealth and riches are in his house; his righteousness will endure forever.
Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
4 Light shines in the darkness for the godly person; he is gracious, merciful, and just.
Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.
5 It goes well for the man who deals graciously and lends money, who conducts his affairs with honesty.
Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
6 For he will never be moved; the righteous person will be remembered forever.
Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
7 He does not fear bad news; he is confident, trusting in Yahweh.
Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
8 His heart is tranquil, without fear, until he looks in triumph over his adversaries.
Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
9 He generously gives to the poor; his righteousness endures forever; he will be exalted with honor.
Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
10 The wicked person will see this and be angry; he will grind his teeth in rage and he will melt away; the desire of the wicked people will perish.
Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya, ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ; olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.

< Psalms 112 >