< Isaiah 59 >
1 Look, Yahweh's hand is not so short that it cannot save; nor his ear so dull, that it cannot hear.
Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
2 Your sinful acts, however, have separated you from your God, and your sins have made him hide his face from you and from hearing you.
Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.
3 For your hands are stained with blood and your fingers with sin. Your lips speak lies and your tongue speaks maliciously.
Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
4 No one calls in righteousness, and none pleads his case in truth. They trust in empty words, and tell lies; they conceive trouble and give birth to sin.
Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
5 They hatch eggs of a poisonous snake and weave a spider's web. Whoever eats of their eggs dies, and if an egg is crushed, it hatches into a poisonous snake.
Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
6 Their webs cannot be used for garments, nor can they cover themselves with their works. Their works are works of sin, and deeds of violence are in their hands.
Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
7 Their feet run to evil, and they run to pour out innocent blood. Their thoughts are thoughts of sin; violence and destruction are their roads.
Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
8 The way of peace they do not know, and there is no justice in their paths. They have made crooked paths; whoever travels these paths does not know peace.
Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.
9 Therefore justice is far from us, nor does righteousness reach us. We wait for light, but see darkness; we look for brightness, but we walk in darkness.
Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
10 We grope for the wall like the blind, like those who cannot see. We stumble at noonday as in the twilight; among the strong we are like dead men.
Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
11 We growl like bears and moan like doves; we wait for justice, but there is none; for rescue, but it is far from us.
Anyị na-agbọ ụja dịka bịa; anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ. Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka; anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.
12 For our many transgressions are before you, and our sins testify against us; for our transgressions are with us, and we know our sins.
Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị; ọ na-agbakwa ama megide anyị. E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ, nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.
13 We have rebelled, denying Yahweh and turning away from following our God. We have spoken extortion and turning aside, conceived complaining from the heart and words of lying.
Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị Onyenwe anyị; anyị esitela nʼiso Onyenwe anyị Chineke anyị wezuga onwe anyị, nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi. Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta.
14 Justice is driven back, and righteousness stands far off; for truth stumbles in the public square, and right cannot come.
Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.
15 Trustworthiness has gone away, and he who turns away from evil makes himself a victim. Yahweh saw it and was displeased that there was no justice.
E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.
16 He saw that there was no man, and wondered that there was no one to intervene. Therefore his own arm brought salvation for him, and his righteousness sustained him.
Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.
17 He put on righteousness as a breastplate and a helmet of salvation upon his head. He clothed himself with garments of vengeance and wore zeal as a mantle.
Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.
18 He repaid them for what they had done, angry judgment to his adversaries, vengeance to his enemies, to the islands punishment as their reward.
Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.
19 So they will fear the name of Yahweh from the west, and his glory from the sun's rising; for he will come as a rushing stream, driven by the breath of Yahweh.
Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị, sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya. Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.
20 “A redeemer will come to Zion and to those who turn from their rebellious deeds in Jacob—this is Yahweh's declaration.
“Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn; ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
21 As for me, this is my covenant with them—says Yahweh—my spirit who is upon you, and my words which I have put in your mouth, will not leave your mouth, or go out of the mouth of your children, or go out of the mouth of your children's children—says Yahweh—from this time and forever.”
“Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka Onyenwe anyị kwuru.