< Genesis 47 >
1 Then Joseph went in and told Pharaoh, “My father and my brothers, their flocks, their herds, and all that they own, have arrived from the land of Canaan. See, they are in the land of Goshen.”
Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.”
2 He took five of his brothers and introduced them to Pharaoh.
Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero.
3 Pharaoh said to his brothers, “What is your occupation?” They said to Pharaoh, “Your servants are shepherds, as our ancestors.”
Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.”
4 Then they said to Pharaoh, “We come as temporary residents in the land. There is no pasture for your servants' flocks, because the famine is severe in the land of Canaan. So now, please let your servants live in the land of Goshen.”
Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.”
5 Then Pharaoh spoke to Joseph, saying, “Your father and your brothers have come to you.
Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen.
6 The land of Egypt is before you. Settle your father and your brothers in the best region, the land of Goshen. If you know any capable men among them, put them in charge of my livestock.”
Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.”
7 Then Joseph brought in Jacob his father and presented him to Pharaoh. Jacob blessed Pharaoh.
Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.
8 Pharaoh said to Jacob, “How long have you lived?”
Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”
9 Jacob said to Pharaoh, “The years of my travels are a hundred and thirty. The years of my life have been few and painful. They have not been as long as those of my ancestors.”
Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.”
10 Then Jacob blessed Pharaoh and went out from his presence.
Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.
11 Then Joseph settled his father and his brothers. He gave them a territory in the land of Egypt, the best of the land, in the land of Rameses, as Pharaoh had commanded.
Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.
12 Joseph provided food for his father, his brothers, and all his father's household, according the number of their dependents.
Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.
13 Now there was no food in all the land; for the famine was severe. The land of Egypt and the land of Canaan wasted away because of the famine.
Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a.
14 Joseph gathered all the money that was in the land of Egypt and in the land of Canaan, by selling grain to the inhabitants. Then Joseph brought the money to Pharaoh's palace.
Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero.
15 When all the money of the lands of Egypt and Canaan was spent, all the Egyptians came to Joseph saying, “Give us food! Why should we die in your presence because our money is gone?”
Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.”
16 Joseph said, “If your money is gone, bring your livestock and I will give you food in exchange for your livestock.”
Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.”
17 So they brought their livestock to Joseph. Joseph gave them food in exchange for the horses, for the flocks, for the herds, and for the donkeys. He fed them with bread in exchange for all their livestock that year.
Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile.
18 When that year was ended, they came to him the next year and said to him, “We will not hide from my master that our money is all gone, and the herds of cattle are my master's. There is nothing left in the sight of my master, except our bodies and our land.
Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.
19 Why should we die before your eyes, both we and our land? Buy us and our land in exchange for food, and we and our land will be servants to Pharaoh. Give us seed that we may live and not die, and that the land may not become desolate.”
Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.”
20 So Joseph bought all the land of Egypt for Pharaoh. For every Egyptian sold his field, because the famine was very severe. In this way, the land became Pharaoh's.
Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero.
21 As for the people, he made them slaves from one end of Egypt's border to the other end.
Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.
22 It was only the land of the priests that Joseph did not buy, because the priests were given an allowance. They ate from the allotment which Pharaoh gave them. Therefore they did not sell their land.
Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.
23 Then Joseph said to the people, “See, I have bought you and your land today for Pharaoh. Now here is seed for you, and you will plant the land.
Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.
24 At the harvest, you must give a fifth to Pharaoh, and four parts will be your own, for seed of the field and for food for your households and your children.”
Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.”
25 They said, “You have saved our lives. May we find favor in your eyes. We will be Pharaoh's servants.”
Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.”
26 So Joseph made it a statute which is in effect in the land of Egypt to this day, that one-fifth belongs to Pharaoh. Only the land of the priests did not become Pharaoh's.
Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a.
27 So Israel lived in the land of Egypt, in the land of Goshen. His people gained possessions there. They were fruitful and multiplied greatly.
Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ.
28 Jacob lived in the land of Egypt seventeen years, so the years of Jacob's life were one hundred forty-seven years.
Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa.
29 When the time approached for Israel to die, he called his son Joseph and said to him, “If now I have found favor in your eyes, put your hand under my thigh, and show me faithfulness and trustworthiness. Please do not bury me in Egypt.
Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt.
30 When I sleep with my fathers, you will carry me out of Egypt and bury me in my forefathers' burial place.” Joseph said, “I will do as you have said.”
Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”
31 Israel said, “Swear to me,” and Joseph swore to him. Then Israel bowed down at the head of his bed.
Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.