< Ezekiel 3 >
1 He said to me, “Son of man, what you have found, eat. Eat this scroll, then go speak to the house of Israel.”
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.”
2 So I opened my mouth, and he fed me that scroll.
Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
3 He said to me, “Son of man, feed your belly and fill your stomach with this scroll that I have given to you!” So I ate it, and it was as sweet as honey in my mouth.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
4 Then he said to me, “Son of man, go to the house of Israel and speak my words to them.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile.
5 For you are not being sent to a people of strange speech or difficult language, but to the house of Israel—
Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel.
6 not to many peoples of strange speech or a difficult language, whose words you cannot understand. Surely if I sent you to them, they would have listened to you.
Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.
7 But the house of Israel will not be willing to listen to you, for they are not willing to listen to me. So all the house of Israel is strong browed and hard hearted.
Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.
8 Behold! I have made your face as stubborn as their faces and your brow as hard as their brows.
Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.
9 I have made your brow like a diamond, harder than flint! Do not fear them or be discouraged by their faces, since they are a rebellious house.”
Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”
10 Then he said to me, “Son of man, all the words that I announce to you—take them into your heart and hear them with your ears!
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
11 Then go to the captives, to your people, and speak to them. Say to them, 'This is what the Lord Yahweh says,' whether they will listen or not.”
Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
12 Then the Spirit lifted me up, and I heard behind me the sound of a great earthquake: “Blessed be the glory of Yahweh from his place!”
Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie.
13 It was the sound of the wings of the living creatures as they touched one another, and the sound of the wheels that were with them, and the sound of a great earthquake.
Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
14 The Spirit lifted me up and took me away, and I went with bitterness in my spirit's rage, for the hand of Yahweh was powerfully pressing on me!
Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.
15 So I went to the captives at Tel Aviv who lived along the Kebar Canal, and I stayed there among them for seven days, overwhelmed in amazement.
A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.
16 Then it happened after seven days that the word of Yahweh came to me, saying,
Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
17 “Son of man, I have made you a watchman for the house of Israel, so listen to the word from my mouth, and give them my warning.
“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
18 When I say to the wicked, 'You will surely die' and you do not warn him or speak a warning to the wicked about his evil deeds so he might live—the wicked one will die for his sin, but I will require his blood from your hand.
Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
19 But if you warn the wicked, and he does not turn from his wickedness or from his wicked deeds, then he will die for his sin, but you will have rescued your own life.
Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.
20 If a righteous man turns from his righteousness and acts unjustly, and I set a stumbling block before him, he will die. Because you did not warn him, he will die in his sin, and I will not call to mind the righteous deeds that he performed, but I will require his blood from your hand.
“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.
21 But if you warn the righteous man to stop sinning so that he no longer sins, he will surely live since he was warned; and you will have rescued your own life.”
Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”
22 So the hand of Yahweh was on me there, and he said to me, “Arise! Go out into the plain, and I will speak with you there!”
Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
23 I arose and went out into the plain, and there the glory of Yahweh was staying, like the glory that I had seen beside the Kebar Canal; so I fell on my face.
Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
24 The Spirit came to me and stood me up on my feet; and he spoke with me, and said to me, “Go and shut yourself up within your house,
Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
25 for now, son of man, they will place ropes upon you and tie you so you cannot go out among them.
Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
26 I will make your tongue stick to the roof of your mouth, so you will be mute, and you will not be able to rebuke them, since they are a rebellious house.
Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
27 But when I speak with you, I will open your mouth so you will say to them, 'This is what the Lord Yahweh says.' The one who will hear will hear; the one who will not listen will not listen, for they are a rebellious house!”
Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.