< Numbers 21 >

1 The king of Arad [city] lived in the area where the Canaan people-group lived, in the desert in the southern part of the land. He heard a report that the Israelis were approaching on the road to Atharim [village]. So his army attacked the Israelis and captured some of them.
Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.
2 Then the Israelis solemnly vowed: “Yahweh, if you will help us to defeat these people, we will completely destroy all their towns.”
Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”
3 Yahweh heard what they requested, and he enabled them to defeat the army of the Canaan people-group. The Israeli soldiers killed all the people and destroyed their towns. [Ever since that time], that place has been called Hormah [which means ‘destruction’].
Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.
4 Then the Israelis left Hor Mountain and traveled on the road towards the Red Sea, in order to go around [the land of] Edom. But the people became impatient along the way,
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.
5 and they began to grumble/complain against God and against Moses/me. They said, “Why have you brought us out of Egypt to die here in this desert [RHQ]? There is nothing to eat here, and nothing to drink. And we detest this lousy [manna] food!”
Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”
6 So Yahweh sent poisonous snakes among them. Many of the people were bitten by the snakes and died.
Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
7 Then the people came to Moses/me and cried out, saying, “We [now know that we] have sinned against Yahweh and against you. Pray to Yahweh, asking that he will take away the snakes!” So Moses/I prayed for the people.
Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.
8 Then Yahweh told him/me, “Make a model/image of a poisonous snake, and attach it to the top of a pole. If those who are bitten by the snakes look at that model, they will (recover/get well).”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”
9 So Moses/I made a snake from bronze and attached it to the top of a pole. Then, when those who had been bitten by a snake looked at the bronze snake, they recovered!
Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
10 Then the Israelis traveled to Oboth and (camped/set up their tents) there.
Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot.
11 Then they left there, and went to Iye-Abarim, in the desert on the eastern border of Moab.
Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.
12 From there they traveled to the valley where the Zered riverbed is, and camped there.
Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.
13 Then they traveled to the north side of the Arnon [River]. That area is in the desert next to the land where the Amor people-group lived. The Arnon [River] is the boundary between Moab and where the Amor people-group lived.
Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.
14 That is why in the book called ‘The Book of the Wars of Yahweh’ it tells about “Waheb [town] in the Suphah area, and the ravines there; and the Arnon [River]
Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
15 and the ravines there, which extend as far as Ar [village] on the border of Moab.”
na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”
16 From there, the Israelis traveled to Beer. There was a well there, where Yahweh previously had said to Moses/me, “Gather the people together, and I will give them water.”
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”
17 There the Israelis sang this song: “O well, give us water! Sing about this well!
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!
18 Sing about this well which our leaders dug; they dug out [the dirt] with their royal scepters and their walking sticks.” Then the Israelis left that desert and went through Mattanah,
Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.
19 Nahaliel, and Bamoth [villages].
Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot.
20 Then they went to the valley in Moab where Pisgah [Mountain] rises above the desert.
Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
21 Then the Israelis sent messengers to Sihon, the king of the Amor people-group. This was the message [that they/we gave him]:
Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,
22 “Allow us to travel through your country. We will stay on the king’s highway, [the main road that goes from the south to the north], until we have finished traveling through your land. We will not walk through any field or vineyard, or drink water from your wells.”
“Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”
23 But King Sihon refused. He would not allow them to walk through his land. Instead, he sent his whole army to attack the Israelis in the desert. They attacked the Israelis at Jahaz [village].
Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.
24 But the Israelis completely defeated them and occupied their land, from the Arnon [River in the south] to the Jabbok [River in the north]. They stopped at the border of the land where the Ammon people-group lived, because [the Ammon army was defending] the border strongly.
Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.
25 So the Israelis occupied all the cities and towns where the Amor people-group lived, and some of the Israelis began to live in them. They occupied Heshbon [city] and the nearby villages.
Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
26 Heshbon was the capital of the country. It was the city where King Sihon ruled. His army had previously defeated the army of the king of Moab, and then his people had begun to live in all of the land of Moab as far as the Arnon [River in the south].
Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.
27 For that reason, one of the poets wrote long ago, “Come to Heshbon, the city where King Sihon [ruled]. We want the city to be restored/rebuilt.
Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.
28 A fire blazed from Heshbon; it burned down Ar [city] in Moab, it destroyed [everything on] the hills along the Arnon [River].
“Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.
29 You people of Moab, terrible things have happened to you! You people who [worship your god] Chemosh have been (annihilated/wiped out)! The men who [worshiped] [MET] Chemosh have run away and are now refugees, and the women [who worshiped him] have been captured by [the army of] Sihon, the king of the Amor people-group.
Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.
30 But we have defeated [Sihon and] those descendants of Amor, all the way from Heshbon [in the north] to Dibon [city in the south]. We have completely obliterated/destroyed them as far as Nophah and Medeba [towns].”
“Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.”
31 So the Israeli people began to live in the land where the Amor people-group lived.
Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait.
32 After Moses/I sent some men to explore the area near Jazer [city], Israeli people began to live in all the towns in that region and expelled the Amor people-group who lived there.
Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
33 Then they turned [north] toward the Bashan region, but King Og of Bashan and all his army attacked them at Edrei [town].
Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
34 Yahweh said to Moses/me, “Do not be afraid of Og, because I am going to enable your men to defeat him and his army, and to take possession of all his land. You will do to him what you did to Sihon, the king of the Amor people-group, who ruled in Heshbon.”
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
35 And that is what happened. We Israelis defeated Og’s army, and killed King Og and his sons and all his people. Not a person survived! And then we Israelis began to live in their land.
Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.

< Numbers 21 >