< Acts 27 >
1 When it was decided that we would sail to Italy, they transferred Paul and some other prisoners to a centurion named Julius, of the Augustan Cohort.
Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.
2 We got on board a ship of Adramyttium and put out to sea, intending to sail by the ports along the coast of Asia. With us was Aristarchus, a Macedonian of Thessalonica.
Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.
3 The next day we put in at Sidon, and Julius treated Paul kindly, allowing him to go to his friends and receive care.
Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.
4 From there we put out to sea and sailed under the lee of Cyprus, because the winds were against us.
Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs.
5 After sailing across the open sea off Cilicia and Pamphylia, we arrived at Myra of Lycia.
Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia.
6 There the centurion found an Alexandrian ship that was sailing to Italy and put us on board.
Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.
7 We sailed along slowly for many days and arrived with difficulty off Cnidus. When the wind did not allow us to hold our course, we sailed under the lee of Crete off Salmone.
Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.
8 Sailing along the coast with difficulty, we came to a place called Fair Havens, which was near the city of Lasea.
Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.
9 Since much time had been lost and the voyage had now become dangerous because the Fast was already over, Paul advised the ship's officers,
Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ,
10 “Men, I perceive that this voyage is going to result in damage and great loss, not only of the cargo and of the ship, but also of our lives.”
na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.”
11 But the centurion was persuaded by the ship's captain and the shipowner rather than by what Paul said.
Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru.
12 Because the harbor was not a suitable place for spending the winter, the majority made a decision to set sail from there also, hoping to somehow reach Phoenix, a harbor of Crete facing southwest and northwest, so that we could spend the winter there.
Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
13 When a south wind started blowing gently, they thought that the opportunity had come for them to carry out their plan. So they weighed anchor and sailed closely along the shore of Crete.
Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit.
14 But before long, a hurricane-force wind called Euroclydon swept down from the island.
Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata.
15 When the ship was caught by the storm and could not head into the wind, we gave way to it and were driven along.
Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.
16 Running under the lee of a small island called Clauda, we were able with difficulty to secure the skiff.
Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.
17 After hoisting it up, the sailors used supports to undergird the ship. Then, fearing they might run aground on the Syrtis, they lowered the gear, and in this manner the ship was driven along.
Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.
18 The next day, because we were being severely battered by the storm, the sailors began throwing the cargo overboard.
Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.
19 On the third day we threw the ship's tackle overboard with our own hands.
Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.
20 When neither sun nor stars appeared for many days, and the violent storm continued to rage, all hope that we might be saved was lost.
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.
21 Since there had been little desire to eat, Paul stood up among them and said, “Men, you should have listened to my advice not to set sail from Crete; then you would have spared yourselves this damage and loss.
Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a.
22 But now I advise you to be of good cheer, for there will be no loss of life among you, but only of the ship.
Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.
23 For this very night an angel of the God to whom I belong and whom I serve stood beside me
Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m,
24 and said, ‘Do not be afraid, Paul; yoʋ must stand before Caesar. And behold, God has granted yoʋ the safety of all who are sailing with yoʋ.’
ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’
25 Therefore be of good cheer, men, for I have faith in God that it will happen just as I have been told.
Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m.
26 But we must run aground on some island.”
Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
27 When the fourteenth night had come, as we were being driven across the Adriatic Sea, about midnight the sailors suspected that they were approaching some land.
Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
28 So they took a sounding and found it to be twenty fathoms. After going a little farther, they took another sounding and found it to be fifteen fathoms.
Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.
29 Fearing that we might run aground on the rocks, they let down four anchors from the stern and prayed for daybreak to come.
Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
30 Then the sailors tried to escape from the ship by lowering the skiff into the sea under the pretense that they were going to lay out anchors from the bow.
Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
31 So Paul said to the centurion and the soldiers, “If these men do not remain in the ship you cannot be saved.”
Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.”
32 Then the soldiers cut away the ropes of the skiff and let it drift away.
Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33 When daybreak was about to come, Paul encouraged them all to take some food, saying, “Today is the fourteenth day that you have continued in suspense without eating, having taken nothing.
Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.
34 Therefore I urge you to take some food, for this is important for your survival, since not a hair will fall from the head of any one of you.”
Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.”
35 After saying this, Paul took some bread and gave thanks to God in the presence of them all. Then he broke it and began to eat.
Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
36 They were all encouraged and took food themselves.
Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri.
37 (Altogether there were two hundred seventy-six of us on the ship.)
Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
38 When they had eaten their fill of food, they began to lighten the ship by throwing the wheat out into the sea.
Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
39 When daybreak came, the sailors did not recognize the land. But they noticed a bay with a beach and decided that, if possible, they would run the ship ashore there.
Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee.
40 So they cut away the anchors and left them in the sea, at the same time loosening the bands of the rudders. Then they hoisted the foresail up into the blowing wind and made for the beach.
Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.
41 But they struck a sandbar and ran the ship aground. The bow stuck fast and remained immovable, and the stern was being broken apart by the force of the waves.
Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.
42 The soldiers' plan was to kill the prisoners, so that none of them would swim away and escape.
Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.
43 But the centurion, wishing to save Paul's life, kept them from carrying out their plan. So he ordered those who could swim to jump overboard first and get to land,
Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.
44 and the rest were to follow, some on planks and some on pieces of the ship. And so it was that they were all brought safely to land.
Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.