< Isaiah 29 >

1 Alas for Ariel, Ariel, The city against which, David encamped, —Add ye a year to a year. Let the festivals, come round;
Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel, gị obodo ebe Devid bi. Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.
2 Yet will I bring Ariel into straits, —And she shall become a bewailing and wailing, Yea she shall become to me a veritable Hearth of God.
Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
3 And I will encamp round about against thee, —And lay siege against thee with a fort, And raise against thee siege-works;
Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
4 And thou shalt be brought low—Out of the earth, shalt thou speak, And out of the dust, shalt thou lower thine utterance, —And as one that hath a familiar spirit, Out of the earth, shall come thy voice, And out of the dust, thy speech shall chirp;
Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
5 Then shall be as fine dust the multitude of thy foreigners, —And as chaff that passeth away, the multitude of tyrants; And it shall come to pass, in a twinkling, Suddenly,
Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
6 From Yahweh of hosts, shalt thou be visited, With thunder, and with earthquake and a great noise, hurricane and storm and flame of fire devouring;
mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.
7 And it shall be like the dream of a night vision, With the multitude of all the nations who have been making war against Ariel, —Even with all who have been making war against her and her stronghold and who have been laying siege to her;
Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha, bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha, ga-efu dịka nrọ, onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.
8 Yea it shall be As when the hungry man dreameth and lo! he is eating, But he awaketh, and his soul, is empty, Or as when the thirsty man dreameth and lo! he is drinking, But he awaketh and lo! he is faint and his soul, is craving, So, shall it be with the multitude of all the nations, that have come forth to war against Mount Zion.
Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.
9 Stand ye stock still and stare, Besmear your eyes and be blind, —They are drunken but not with wine, They reel, but not with strong drink;
Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
10 For Yahweh, hath poured out upon you, a spirit of deep sleep, Yea hath tightly shut your eyes—the prophets, —And, your heads—the seers, hath he covered,
Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
11 And so all vision hath become unto you as the words of a writing that is sealed, Which is delivered unto one acquainted with writing, saying, Pray thee read this, And he saith, I cannot, for it is sealed;
Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
12 And then the writing is delivered to one unacquainted with writing, saying, Pray thee read this, And he saith I am not acquainted with writing.
Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”
13 Wherefore My Lord hath said, —Because this people, hath drawn near with their mouth, And with their lips, have honoured me, But their heart, have they moved far from me, And so their reverence of me hath become A commandment of men in which they have been schooled,
Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
14 Therefore, behold me! again dealing wonderfully with this people, doing wonderfully a wonderful thing, —So shall perish, the wisdom of their wise men, And the intelligence of their intelligent men, shall vanish!
Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
15 Alas! for them who would fain have been too deep for Yahweh by giving secret counsel, —and therefore in the dark, have been their doings, and they have said Who can see us? and—Who can understand us?
Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
16 Your perverseness! As if like clay, the potter could be reckoned; For shall, the thing made say of him that made it, he made me not? Or hath the thing fashioned ever said of him that fashioned it, He hath no understanding.
Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?
17 Is it not yet a very little while, And Lebanon shall be turned, into garden land, —And garden land, for a forest, be reckoned?
Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
18 Therefore, in that day, shall the deaf hear the words of a book, —And out of gloom and darkness, the eyes of the blind shall see;
Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.
19 And again shall the humbled in Yahweh, have joy, —And the needy of mankind in the Holy One of Israel, exult;
Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
20 For the tyrant, hath vanished, And the scoffer, is no more, Yea cut off are all who watch for iniquity: —
Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,
21 Who bring a man into condemnation with a rumour, And for him that decideth in the gate, lay a snare, —And have driven away, for a thing of nought, one who was righteous.
bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
22 Therefore, Thus, saith Yahweh, concerning the house of Jacob, [even he saith it] who redeemed Abraham, —Not now, shall, Jacob turn pale, And, not now, shall their faces whiten;
Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
23 For, when he seeth his children the work of my hands, in his midst, They will hallow my Name, —Yea they will hallow the Holy One of Jacob, And the God of Israel, will they regard with awe.
Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.
24 Then will they who erred in spirit comprehend, And the murmurers, accept instruction.
Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”

< Isaiah 29 >