< 2 Chronicles 21 >

1 And Jehoshaphat slept with his fathers, and was buried with his fathers, in the city of David, —and Jehoram his son reigned in his steed.
Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 Now, he, had brethren, sons of Jehoshaphat—Azariah and Jehiel and Zechariah and Azariah, and Michael and Shephatiah, —all these, were sons of Jehoshaphat king of Israel,
Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.
3 and their father gave them large presents—of silver and of gold and of precious things, with cities of defence, in Judah, —but, the kingdom, gave he unto Jehoram, for, he, was the firstborn.
Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
4 But, when Jehoram had arisen over the kingdom of his father, he strengthened himself, and slew all his brethren, with the sword, —moreover also some of the rulers of Israel.
Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel.
5 Thirty-two years old, was Jehoram when he began to reign, —and, eight years, reigned he in Jerusalem.
Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
6 And he walked in the way of the kings of Israel, like as did the house of Ahab, for, the daughter of Ahab, had he, to wife, —so he wrought wickedness, in the eyes of Yahweh.
O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
7 Howbeit Yahweh was not willing to destroy the house of David, because of the covenant which he had solemnised, unto David, —and as he had promised to give unto him a lamp, and unto his sons, all the days.
Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
8 In his days, revolted the Edomites, from under the hand of Judah, —and set over themselves a king.
Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
9 So Jehoram passed over, with his captains, and all his chariot, with him, -and it came to pass that he rose up by night, and smote the Edomites that were round about unto him, and the chariot-captains.
Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu.
10 So Edom revolted from under the hand of Judah—unto this day. Then, must Libnah needs revolt at the same time, from under his hand, —because he had forsaken Yahweh, the God of his fathers.
Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.
11 He too, made high places among the mountains of Judah, —and caused the inhabitants of Jerusalem to be unchaste, and seduced Judah.
O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.
12 Then came there unto him, a writing, from Elijah the prophet, saying, —Thus, saith Yahweh, God of David thy father, Because thou hast not walked in the ways of Jehoshaphat thy father, nor in the ways of Asa, king of Judah;
Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
13 but hast walked in the way of the kings of Israel, and hast caused Judah and the inhabitants of Jerusalem to be unchaste, after the unchastities of the house of Ahab, —moreover also, thine own brethren of the house of thy father who were better than thou, hast thou slain,
kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.
14 lo! Yahweh, is about to plague, with a great plague, thy people, -and thy children and thy wives, and all thy possessions;
Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.
15 also, thyself, with sore diseases, with disease of thy bowels, -until thy bowels shall fall out, by reason of the disease, in a year added to a year.
Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’”
16 And Yahweh stirred up against Jehoram the spirit of the Philistines, and the Arabians, who were under the direction of the Ethiopians;
Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha.
17 and they came up against Judah, and forced their way into it, and carried off all the possessions that were found belonging to the house of the king, moreover also his sons and his wives, —so that there was left him never a son, save only Jehoahaz the youngest of his sons.
Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
18 And, after all this, Yahweh plagued him in his bowels with an incurable disease.
Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.
19 And it came to pass, in a year beyond a year, even when the end of the days of two years had passed, that his bowels fell out by reason of his disease, so that he died, of, malignant disease, —and his people made him no burning, like the burning of his fathers.
Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
20 Thirty-two years old, was he when he began to reign, and, eight years, reigned he in Jerusalem, —and went his way—unregretted, and, though they buried him in the city of David, yet, not in the sepulchres of the kings.
Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.

< 2 Chronicles 21 >