< Job 22 >
1 Then answered Eliphaz the Temanite, and said,
Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
2 Can a man be profitable unto God? surely he that is wise is profitable unto himself.
“Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
3 Is it any pleasure to the Almighty, that thou art righteous? or is it gain [to him], that thou makest thy ways perfect?
O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
4 Is it for thy fear [of him] that he reproveth thee, that he entereth with thee into judgment?
“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
5 Is not thy wickedness great? neither is there any end to thine iniquities.
Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
6 For thou hast taken pledges of thy brother for nought, and stripped the naked of their clothing.
Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
7 Thou hast not given water to the weary to drink, and thou hast withholden bread from the hungry.
I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
8 But as for the mighty man, he had the earth; and the honourable man, he dwelt in it.
Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
9 Thou hast sent widows away empty, and the arms of the fatherless have been broken.
Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
10 Therefore snares are round about thee, and sudden fear troubleth thee,
Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
11 Or darkness, that thou canst not see, and abundance of waters cover thee.
Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
12 Is not God in the height of heaven? and behold the height of the stars, how high they are!
“Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
13 And thou sayest, What doth God know? can he judge through the thick darkness?
Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
14 Thick clouds are a covering to him, that he seeth not; and he walketh in the circuit of heaven.
Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
15 Wilt thou keep the old way which wicked men have trodden?
Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
16 Who were snatched away before their time, whose foundation was poured out as a stream:
E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
17 Who said unto God, Depart from us; and, What can the Almighty do for us?
Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
18 Yet he fired their houses with good things: but the counsel of the wicked is far from me.
Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
19 The righteous see it, and are glad; and the innocent laugh them to scorn:
Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
20 [Saying], Surely they that did rise up against us are cut off, and the remnant of them the fire hath consumed.
‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
21 Acquaint now thyself with him, and be at peace: thereby good shall come unto thee.
“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
22 Receive, I pray thee, the law from his mouth, and lay up his words in thine heart.
Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
23 If thou return to the Almighty, thou shalt be built up; if thou put away unrighteousness far from thy tents.
Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
24 And lay thou [thy] treasure in the dust, and [the gold of] Ophir among the stones of the brooks;
tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
25 And the Almighty shall be thy treasure, and precious silver unto thee.
Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
26 For then shalt thou delight thyself in the Almighty, and shalt lift up thy face unto God.
Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
27 Thou shalt make thy prayer unto him, and he shall hear thee; and thou shalt pay thy vows.
Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
28 Thou shalt also decree a thing, and it shall be established unto thee; and light shall shine upon thy ways.
Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
29 When they cast [thee] down, thou shalt say, [There is] lifting up; and the humble person he shall save.
Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
30 He shall deliver [even] him that is not innocent: yea, he shall be delivered through the cleanness of thine hands.
Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”