< Titus 1 >

1 Paul, a servant of God, and an apostle of Christ Jesus, for the faith of God's elect, and the knowledge of the truth which is according to godliness,
Akwụkwọ ozi a si nʼaka m, Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye ahọpụtara ime ka okwukwe ndị Chineke, na nghọta banyere ịmara eziokwu ahụ na-eduba na ndụ ịsọpụrụ Chineke gaa nʼihu,
2 in hope of everlasting life, which God, who cannot lie, promised from the most ancient times, (aiōnios g166)
nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge. (aiōnios g166)
3 but in his own seasons manifested his word through the preaching with which I was intrusted by the commandment of God our Saviour:
Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.
4 to Titus, true child after the common faith: Grace and peace from God the Father and Christ Jesus our Saviour.
Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.
5 For this cause I left thee behind in Crete, that thou shouldst set in order the things that are wanting, and appoint elders in every city, as I directed thee;
Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.
6 if any one is without reproach, the husband of one wife, having believing children, that are not accused of dissoluteness, or unruly.
Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.
7 For a bishop must be without reproach, as God's steward; not self-willed, not soon angry, not given to wine, not a striker, not greedy of base gain,
Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya.
8 but hospitable, a lover of what is good, discreet, just, holy, temperate,
Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke.
9 holding fast the sure word according to what he was taught, that he may be able by sound teaching both to exhort, and to refute the gainsayers.
Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu.
10 For there are many unruly vain talkers and deceivers, especially they of the circumcision;
Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta.
11 whose mouths must be stopped, since they overturn whole houses, teaching things which they ought not, for the sake of base gain.
Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.
12 One of themselves, even a prophet of their own, said: “The Cretans are always liars, evil beasts, slothful gluttons.”
Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”
13 This testimony is true; for which cause rebuke them sharply, that they may be sound in the faith,
Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe,
14 not giving heed to Jewish fables, and commandments of men who turn away from the truth.
ka ha kwụsị ige ntị nʼakụkọ ifo ndị Juu na-akọ, maọbụ iwu nke ndị jụrụ ịnabata eziokwu nyere.
15 To the pure all things are pure; but to the defiled and unbelieving nothing is pure, but both their mind and conscience are defiled.
Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.
16 They profess that they know God, but by their works they deny him, being abominable and disobedient, and for every good work reprobate.
Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.

< Titus 1 >