< Mark 1 >

1 The beginning of the gospel of Jesus Christ;
Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
2 as it is written in Isaiah the prophet: “Lo! I send my messenger before thy face, who shall prepare thy way;”
Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
3 “The voice of one crying in the wilderness, Prepare the way of the Lord, make straight his paths!”
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’”
4 John the Baptizer appeared in the wilderness, preaching a baptism of repentance for the remission of sins.
Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
5 And there went out to him all the country of Judaea, and all they of Jerusalem and were baptized by him in the river Jordan, confessing their sins.
Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
6 And John was clothed with camel's hair, and with a leathern girdle about his loins, and he ate locusts and wild honey.
Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
7 And he preached, saying, There cometh after me one mightier than I, the latchet of whose sandals I am not worthy to stoop down and loose.
O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
8 I have baptized you with water; but he will baptize you in the Holy Spirit.
Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
9 And it came to pass that in those days Jesus came from Nazareth of Galilee, and was baptized by John in the Jordan.
Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
10 And immediately on coming up out of the water, he saw the heavens parted, and the Spirit descending as a dove upon him.
Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
11 And there was a voice from the heavens, “Thou art my beloved Son; with thee I am well pleased.”
Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
12 And immediately the Spirit driveth him forth into the wilderness.
Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
13 And he was in the wilderness forty days, tempted by Satan, and was with the wild beasts; and the angels ministered to him.
Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
14 But after John was put in prison, Jesus came into Galilee, preaching the glad tidings of God,
Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
15 [[saying, ]] The time is fulfilled, and the kingdom of God is at hand; repent, and believe the glad tidings.
Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
16 And as he was passing along by the lake of Galilee, he saw Simon and Andrew the brother of Simon dragging a net in the lake; for they were fishers.
Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
17 And Jesus said to them, Come after me, and I will cause you to become fishers of men.
Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
18 And immediately they left their nets, and followed him.
Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
19 And going on a little farther, he saw James the son of Zebedee, and John his brother, who also were in the boat mending the nets;
Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
20 and immediately he called them. And leaving their father Zebedee in the boat with the hired men, they went after him.
Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
21 And they enter Capernaum; and immediately on the sabbath he was teaching in the synagogue.
Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
22 And they were astonished at his teaching; for he taught them as having authority, and not as the scribes.
Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
23 And immediately there was in their synagogue a man with an unclean spirit, and he cried out,
Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
24 saying, What have we to do with thee, Jesus of Nazareth? Thou hast come to destroy us; we know who thou art, the Holy One of God.
sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
25 And Jesus rebuked him, [[saying, ]] Be silent, and come out of him.
Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
26 And the unclean spirit convulsing him, and crying out with a loud voice, came out of him.
Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
27 And they were all amazed, so that they questioned each other, saying, What is this? New teaching with authority; even the unclean spirits doth he command, and they obey him!
Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
28 And immediately his fame spread abroad everywhere through the whole surrounding country of Galilee.
Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
29 And having come out of the synagogue, they immediately entered the house of Simon and Andrew, with James and John.
Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
30 And Simon's wife's mother lay sick of a fever; and they immediately speak to him about her.
Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
31 And he went to her, and took her by the hand, and raised her up; and the fever left her, and she waited on them.
Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
32 And in the evening, when the sun had set, they brought to him all that were sick, and those who were possessed by demons;
Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
33 and the whole city was assembled at the door.
Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
34 And he healed many that were sick with various diseases, and cast out many demons; and he suffered not the demons to speak, because they knew him.
Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
35 And rising early, long before day, he went out, and withdrew into a desert place, and there prayed.
Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
36 And Simon and those with him went in search of him,
Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
37 and found him. And they say to him, All people are in search of thee.
Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
38 And he saith to them, Let us go elsewhere into the neighboring towns, that I may preach there also; for, for this I came forth.
Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
39 And he went, preaching in their synagogues throughout all Galilee, and casting out the demons.
Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
40 And there cometh a leper to him beseeching him, and kneeling down, saying to him, If thou wilt, thou canst cleanse me.
Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
41 And Jesus, moved with compassion, put forth his hand, and touched him, and saith, I will; be thou cleansed.
Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”
42 And immediately the leprosy left him, and he was cleansed.
Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
43 And sternly charging him, he immediately sent him away,
Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
44 saying to him, See that thou say nothing to any one; but go, show thyself to the priest, and offer for thy cleansing what Moses commanded, for a testimony to them.
ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
45 But he went away, and began to publish it constantly, and to spread the matter abroad, so that Jesus could no more enter a city openly, but was without in desert places; and they came to him from every quarter.
Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.

< Mark 1 >