< Luke 8 >
1 And it came to pass afterward, that he journeyed through cities and villages, preaching and publishing the glad tidings of the kingdom of God; and the twelve were with him,
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,
2 and certain women who had been cured of evil spirits and infirmities, Mary called Magdalene, out of whom had come seven demons,
na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,
3 and Joanna, the wife of Chuzas, Herod's steward, and Susanna, and many others, who afforded them aid from their substance.
na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
4 And a great multitude collecting together, and people from the cities going out to him, he spoke by a parable:
Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,
5 A sower went forth to sow his seed; and as he sowed, some seeds fell by the way-side; and they were trodden down, and the birds of the air devoured them.
“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.
6 And others fell upon rocky ground; and when they had sprung up they withered away, because they had no moisture.
Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ.
7 And others fell among thorns; and the thorns sprung up with them, and choked them.
Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.
8 And others fell upon good ground, and sprung up, and bore fruit, a hundred-fold. While saying these things, he cried aloud, He that hath ears to hear, let him hear.
Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
9 And his disciples asked him what this parable meant.
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
10 And he said, To you it hath been given to know the mysteries of the kingdom of God; but to others [[these things are spoken]] in parables; that while seeing they may not see, and while hearing they may not understand.
Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’
11 Now the meaning of the parable is this. The seed is the word of God.
“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.
12 Those by the way-side are they that hear; then cometh the Devil and taketh away the word from their heart, that they may not believe and be saved.
Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta.
13 Those on the rocky ground are they who, when they hear, receive the word with joy; and these have no root; and for a while they believe, and in time of temptation fall away.
Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ.
14 And those seeds which fell among the thorns, these are they who, when they have heard, go away and are choked with the cares and riches and pleasures of life, and bring no fruit to perfection.
Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ.
15 But the seeds on the good ground, these are they who in an honest and good heart, when they have heard the word, hold it fast, and bear fruit with constancy.
Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
16 And no one having lighted a lamp, covereth it with a vessel, or putteth it under a bed; but setteth it on a lampstand, that those who come in may see the light.
“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
17 For nothing is secret, that will not be made manifest; nor hidden, that will not be known, and come to light.
Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè.
18 Take heed therefore how ye hear; for whoever hath, to him will be given; and whoever hath not, from him will be taken even what he seemeth to have.
Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”
19 And his mother and his brothers came where he was, and could not get to him on account of the crowd.
Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ.
20 And word was brought to him, Thy mother and thy brothers stand without, desiring to see thee.
Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.”
21 And he answering said to them, My mother and my brothers are these, who hear the word of God, and do it.
Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”
22 Now it came to pass on a certain day, that he went into a boat with his disciples, and said to them, Let us go over to the other side of the lake; and they put off.
Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,
23 But as they were sailing, he fell asleep. And there came down a storm of wind on the lake, and they were filling with water, and were in jeopardy.
ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
24 And they came and awoke him, saying, Master, master, we are perishing! And he rose, and rebuked the wind, and the surging of the water; and they ceased, and there was a calm.
Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii.
25 And he said to them, Where is your faith? And they were afraid, and wondered, saying one to another, Who then is this, that he commandeth even the winds and the water, and they obey him?
Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”
26 And they sailed to the country of the Gergesenes, which is over against Galilee.
Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili.
27 And when he had landed, there met him a certain man out of the city who had demons, and for a long time had worn no clothes, and abode not in a house, but in the tombs.
Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.
28 And seeing Jesus, he cried out, and fell down before him, and said with a loud voice, What have I to do with thee, Jesus, Son of the most high God? I beseech thee, do not torment me.
Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”
29 For he was about to command the unclean spirit to come out of the man; for it had possessed him for a long time, and he had been kept bound and secured with chains and fetters; and bursting the bands, he had been driven by the demon into the wilderness.
Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.
30 And Jesus asked him, saying, What is thy name? And he said, Legion; because many demons had entered into him.
Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.
31 And they besought him not to command them to go away into the abyss. (Abyssos )
Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis. (Abyssos )
32 Now there was there a herd of many swine feeding on the mountain; and they besought him to permit them to go into them. And he permitted them.
Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike.
33 And the demons coming out of the man went into the swine; and the herd rushed down the steep into the lake, and were drowned.
Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha.
34 And the herdsmen, seeing what was done, fled, and told the news in the city and in the country.
Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere.
35 And they went out to see what had been done. And they came to Jesus and found the man from whom the demons had gone out sitting, clothed, and in his right mind, at the feet of Jesus; and they were afraid.
Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha.
36 And they who had seen it told them how he that was possessed by demons was made well.
Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
37 And the whole multitude in the surrounding country of the Gergesenes besought him to depart from them; for they were seized with great fear. And he went on board a boat and returned.
Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi.
38 And the man out of whom the demons had gone besought him that he might be with him. But he sent him away, saying,
Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya,
39 Return to thy house, and tell what great things God hath done for thee. And he went and published through the whole city what great things Jesus had done for him.
“Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.
40 And it came to pass when Jesus returned, that the multitude welcomed him; for they were all waiting for him.
Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.
41 And lo! there came a man, named Jairus, and he was a ruler of the synagogue; and falling at the feet of Jesus, he besought him to come into his house;
Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya.
42 for he had an only daughter, about twelve years of age, and she was dying. And as he went, the multitudes thronged him.
Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
43 And a woman who had had an issue of blood twelve years, and had spent all her living upon physicians, and could not be cured by any one,
Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
44 came up behind and touched the fringe of his garment; and immediately her issue of blood ceased.
O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
45 And Jesus said, Who touched me? And when all denied it, Peter and those with him said, Master, the multitudes are thronging thee, and pressing against thee.
Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
46 But Jesus said, Some one touched me; for I perceived that power went out from me.
Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”
47 And the woman, seeing that she was discovered, came trembling, and falling down before him declared before all the people for what cause she had touched him, and how she was cured immediately.
Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.
48 And he said to her, Daughter, thy faith hath made thee well; go in peace.
Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”
49 While he was yet speaking, there cometh one from the house of the ruler of the synagogue, saying, Thy daughter is dead; trouble not the Teacher any further.
Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”
50 But Jesus hearing this, answered him, Fear not; only believe, and she will be made well.
Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.”
51 And going into the house, he suffered no one to go in with him but Peter and John and James, and the father of the maiden, and the mother.
Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ.
52 And all were weeping, and lamenting for her. But he said, Weep not; she is not dead, but sleeping.
Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”
53 And they laughed him to scorn, knowing that she was dead.
Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ.
54 But he took hold of her hand, and called aloud, saying, Maiden, arise!
Ma o jidere ya nʼaka, sị, “Nwa m, bilie!”
55 And her spirit returned, and she immediately arose. And he ordered food to be given to her.
Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie.
56 And her parents were amazed. But he charged them to tell no one what had been done.
Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.