< Job 33 >

1 Hear, therefore, my discourse, I pray thee, O Job! And attend unto all my words!
“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.
2 Behold, I am opening my mouth; My tongue is now speaking in my palate.
Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.
3 My words shall be in the uprightness of my heart; My lips shall utter knowledge purely.
Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.
4 The spirit of God made me, And the breath of the Almighty gave me life.
Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.
5 If thou art able, answer me; Set thyself in array against me; stand up!
Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
6 Behold, I, like thee, am a creature of God; I also was formed of clay.
Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
7 Behold, my terror cannot dismay thee, Nor can my greatness be heavy upon thee.
Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
8 Surely thou hast said in my hearing, I have heard the sound of thy words:
“Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
9 “I am pure, and without transgression; I am clean, and there is no iniquity in me.
‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.
10 Behold, He seeketh causes of hostility against me; He regardeth me as his enemy.
Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.
11 He putteth my feet in the stocks; He watcheth all my paths.”
Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’
12 Behold, in this thou art not right; I will answer thee; For God is greater than man.
“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.
13 Why dost thou contend with Him? For he giveth no account of any of his doings.
Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?
14 For God speaketh once, Yea, twice, when man regardeth it not.
Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.
15 In a dream, in a vision of the night, When deep sleep falleth upon men, In slumber upon the bed;
Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.
16 Then openeth he the ears of men, And sealeth up for them admonition;
O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
17 That he may turn man from his purpose, And hide pride from man.
ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,
18 Thus he saveth him from the pit, Yea, his life from perishing by the sword.
ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
19 He is chastened also with pain upon his bed, And with a continual agitation of his bones,
“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.
20 So that his mouth abhorreth bread, And his taste the choicest food;
Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
21 His flesh is consumed, that it cannot be seen, And his bones, that were invisible, are naked;
Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.
22 Yea, his soul draweth near to the pit, And his life to the destroyers.
Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
23 But if there be with him a messenger, An interpreter, one of a thousand, Who may show unto man his duty,
Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,
24 Then will God be gracious to him, and say, “Save him from going down to the pit: I have found a ransom.”
ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
25 His flesh shall became fresher than a child's; He shall return to the days of his youth.
Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’
26 He shall pray to God, and he will be favorable to him, And permit him to see his face with joy, And restore unto man his righteousness.
Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
27 He shall sing among men, and say, “I sinned; I acted perversely; Yet hath he not requited me for it:
Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
28 He hath delivered me from going down to the pit, And my life beholdeth the light.”
ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
29 Lo! all these things doeth God Time after time with man,
“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
30 That he may bring him back from the pit, That he may enjoy the light of the living.
Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
31 Mark well, O Job! hearken to me! Keep silence, and I will speak.
“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu.
32 Yet if thou hast any thing to say, answer me! Speak! for I desire to pronounce thee innocent.
Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.
33 But if not, do thou listen to me! Keep silence, and I will teach thee wisdom!
Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”

< Job 33 >