< Hosea 14 >

1 Return, O Israel, to Jehovah thy God; For thou hast fallen by thine iniquity.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
2 Take with you words, And return to Jehovah, saying, “Forgive all our iniquity, and receive us graciously, And we will render to thee the sacrifices of our lips!
Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
3 Assyria shall not help us; We will not ride on horses; And no more will we say to the work of our hands, Ye are our Gods! For from thee the fatherless obtaineth mercy.”
Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
4 “I will heal their rebellion; I will love them freely; For my anger is turned away from them.
“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
5 I will be as the dew to Israel; He shall blossom as the lily, And strike his roots like Lebanon.
Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
6 His sprouts shall spread forth, And his beauty shall be as the olive-tree, And his fragrance as Lebanon.
ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.
7 They that dwell under his shadow Shall revive as the corn; They shall shoot forth as the vine; Their name shall be like the wine of Lebanon.
Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
8 Ephraim shall say, What have I more to do with idols? I will hear him; I will care for him; I will be like a green cypress-tree; From me shall thy fruit be found.”
Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
9 Who is wise, that he may understand these things, Prudent, that he may know them? For the ways of Jehovah are right, And the righteous walk in them; But in them transgressors stumble.
Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.

< Hosea 14 >