< Luke 23 >

1 The whole company of them rose up and brought him before Pilate.
Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet.
2 They began to accuse him, saying, "We found this man subverting our nation, forbidding paying taxes to Caesar, and saying that he himself is the Christ, a king."
Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”
3 Pilate asked him, "Are you the King of the Jews?" He answered him, "You say so."
Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
4 Pilate said to the chief priests and the crowds, "I find no basis for a charge against this man."
Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
5 But they insisted, saying, "He stirs up the people, teaching throughout all Judea, beginning from Galilee even to this place."
Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
6 But when Pilate heard it, he asked if the man was a Galilean.
Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
7 When he found out that he was in Herod's jurisdiction, he sent him to Herod, who was also in Jerusalem during those days.
Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
8 Now when Herod saw Jesus, he was exceedingly glad, for he had wanted to see him for a long time, because he had heard about him. He hoped to see some miracle done by him.
Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.
9 He questioned him with many words, but he gave no answers.
Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla.
10 The chief priests and the scribes stood, vehemently accusing him.
Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike.
11 Herod with his soldiers treated him with contempt and mocked him. Dressing him in luxurious clothing, they sent him back to Pilate.
Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet.
12 Herod and Pilate became friends with each other that very day, for before that they were enemies with each other.
Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro.
13 Pilate called together the chief priests and the rulers and the people,
Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ
14 and said to them, "You brought this man to me as one that subverts the people, and see, I have examined him before you, and found no basis for a charge against this man concerning those things of which you accuse him.
sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo.
15 Neither has Herod, for he sent him back to us, and see, nothing worthy of death has been done by him.
Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.
16 I will therefore chastise him and release him."
Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
17 (Now he had to release one prisoner to them at the feast.)
Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.
18 But they all shouted out together, saying, "Away with this man. Release to us Barabbas"
Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.”
19 (one who was thrown into prison for a certain revolt in the city, and for murder.)
(Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
20 Then Pilate spoke to them again, wanting to release Jesus,
Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ.
21 but they shouted, saying, "Crucify. Crucify him."
Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
22 He said to them the third time, "Why? What evil has this man done? I have found no capital crime in him. I will therefore chastise him and release him."
Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”
23 But they were urgent with loud voices, asking that he might be crucified. And their voices, and those of the chief priests, prevailed.
Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị.
24 Pilate decreed that what they asked for should be done.
Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.
25 He released him who had been thrown into prison for insurrection and murder, for whom they asked, but he delivered Jesus up to their will.
Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.
26 When they led him away, they grabbed one Simon of Cyrene, coming from the country, and placed on him the cross, to carry it after Jesus.
Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.
27 A large crowd of the people followed him, including women who also mourned and lamented him.
Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ.
28 But Jesus, turning to them, said, "Daughters of Jerusalem, do not weep for me, but weep for yourselves and for your children.
Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.
29 For look, the days are coming in which they will say, 'Blessed are the barren, the wombs that never bore, and the breasts that never nursed.'
Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’
30 Then they will begin to say to the mountains, 'Fall on us,' and to the hills, 'Cover us.'
Mgbe ahụ, “‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!”’
31 For if they do these things in the green tree, what will be done in the dry?"
Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
32 There were also others, two criminals, led with him to be put to death.
Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.
33 When they came to the place that is called The Skull, they crucified him there with the criminals, one on the right and the other on the left.
Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
34 And Jesus said, "Father, forgive them, for they do not know what they are doing." Dividing his garments among them, they cast lots.
Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
35 The people stood watching. The rulers also scoffed at him, saying, "He saved others. Let him save himself, if this is the Christ of God, his Chosen One."
Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”
36 The soldiers also mocked him, coming to him and offering him vinegar,
Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,
37 and saying, "If you are the King of the Jews, save yourself."
ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
38 An inscription was also written above him: "THIS IS THE KING OF THE JEWS."
Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
39 One of the criminals who hung there insulted him, saying, "Are you not the Christ? Save yourself and us."
Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
40 But the other answered, and rebuking him said, "Do you not even fear God, seeing you are under the same condemnation?
Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.
41 And we indeed justly, for we receive the due reward for our deeds; but this man has done nothing wrong."
Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
42 And he said, "Jesus, remember me when you come into your Kingdom."
Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
43 And he said to him, "Assuredly I tell you, today you will be with me in Paradise."
Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
44 And it was now about noon, and darkness came over the whole land until three in the afternoon,
Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.
45 for the sun's light failed. And the veil of the temple was torn in two.
Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ.
46 And Jesus, crying with a loud voice, said, "Father, into your hands I commit my spirit." Having said this, he breathed his last.
Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume.
47 When the centurion saw what was done, he glorified God, saying, "Certainly this was a righteous man."
Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.”
48 All the crowds that came together to see this, when they saw the things that were done, returned home beating their breasts.
Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi.
49 All his acquaintances, and the women who followed with him from Galilee, stood at a distance, watching these things.
Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
50 And look, a man named Joseph, who was a member of the council, a good and righteous man
O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ.
51 (he had not consented to their counsel and deed), from Arimathea, a city of the Judeans, who was also waiting for the Kingdom of God:
Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.
52 this man went to Pilate, and asked for the body of Jesus.
Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.
53 He took it down, and wrapped it in a linen cloth, and placed him in a tomb that was cut in stone, where no one had ever been placed.
Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.
54 It was the day of the Preparation, and the Sabbath was drawing near.
Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.
55 The women, who had come with him out of Galilee, followed after, and saw the tomb, and how his body was placed.
Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya.
56 They returned, and prepared spices and ointments. On the Sabbath they rested according to the commandment.
Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.

< Luke 23 >