< 2 Peter 2 >

1 But false prophets also arose among the people, as false teachers will also be among you, who will secretly bring in destructive heresies, denying even the Master who bought them, bringing on themselves swift destruction.
Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi.
2 Many will follow their immoral ways, and as a result, the way of the truth will be maligned.
Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ.
3 In covetousness they will exploit you with deceptive words: whose sentence now from of old does not linger, and their destruction is not asleep.
Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.
4 For if God did not spare angels when they sinned, but cast them down to the lower parts of Sheol, and committed them to chains of darkness, to be reserved for judgment; (Tartaroō g5020)
Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. (Tartaroō g5020)
5 and did not spare the ancient world, but preserved Noah with seven others, a preacher of righteousness, when he brought a flood on the world of the ungodly;
Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ.
6 and turning the cities of Sodom and Gomorrah into ashes, condemned them to destruction, having made them an example of what is going to happen to the ungodly;
Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;
7 and delivered righteous Lot, who was very distressed by the lustful life of the wicked
ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere
8 (for that righteous man dwelling among them, was tormented in his righteous soul from day to day with seeing and hearing lawless deeds):
(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).
9 the Lord knows how to deliver the godly out of temptation and to keep the unrighteous under punishment for the day of judgment;
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.
10 but chiefly those who walk after the flesh in the lust of defilement, and despise authority. Daring, self-willed, they are not afraid to blaspheme the glories;
Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
11 whereas angels, though greater in might and power, do not bring a railing judgment against them before the Lord.
Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị.
12 But these, as unreasoning creatures, born natural animals to be taken and destroyed, speaking evil in matters about which they are ignorant, will in their destroying surely be destroyed,
Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.
13 suffering the penalty as the wages of evil; people who count it pleasure to revel in the daytime, spots and blemishes, reveling in their deceit while they feast with you;
A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri.
14 having eyes full of adultery, and insatiable for sin, enticing unstable people, having a heart trained in greed. Children under a curse.
Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.
15 Forsaking the right way they went astray, having followed the way of Balaam the son of Beor, who loved the wages of unrighteousness.
Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.
16 But he was rebuked for his own transgression; a donkey that could not talk spoke with a human voice and stopped the irrationality of the prophet.
Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ.
17 These are wells without water, and mists driven by a storm; for whom the blackness of darkness has been reserved.
Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.
18 For, uttering great swelling words of emptiness, they entice in the lusts of the flesh, by licentiousness, those who actually escape from those who live in error;
Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.
19 promising them liberty, while they themselves are slaves of corruption; for a person is brought into bondage by whoever overcomes him.
Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya.
20 For if, after they have escaped the defilement of the world through the knowledge of our Lord and Savior Yeshua the Messiah, they are again entangled in it and overcome, the last state has become worse for them than the first.
Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
21 For it would be better for them not to have known the way of righteousness, than, after knowing it, to turn back from the holy commandment delivered to them.
Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ.
22 It has happened to them according to the true proverb, "The dog turns to his own vomit again," and "the sow that has washed to wallowing in the mire."
Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”

< 2 Peter 2 >