< Genesis 4 >

1 Now Adam had marital relations with his wife Eve, and she conceived, and gave birth to Cain, and said, "I have gotten a man from God."
Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!”
2 Again she gave birth, to Cain's brother Abel. Abel was a keeper of sheep, but Cain was a tiller of the ground.
Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi.
3 As time passed, it happened that Cain brought an offering to God from the fruit of the ground.
Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye.
4 And Abel also brought some of the firstborn of his flock and of its fat. And God looked favorably on Abel and his offering,
Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya,
5 but he did not look favorably on Cain and his offering. Cain was very angry, and the expression on his face fell.
ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ.
6 God said to Cain, "Why are you angry? Why has the expression of your face fallen?
Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ?
7 If you do well, will it not be lifted up? If you do not do well, sin lies in wait at the door. It desires to control you, but you must rule over it."
Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”
8 Cain said to Abel, his brother, "Let's go into the field." It happened when they were in the field, that Cain rose up against Abel, his brother, and killed him.
Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya.
9 Then God said to Cain, "Where is Abel, your brother?" He said, "I do not know. Am I my brother's keeper?"
Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?”
10 And God said, "What have you done? The voice of your brother's blood cries out to me from the ground.
Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala.
11 Now you are cursed because of the ground, which has opened its mouth to receive your brother's blood from your hand.
Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị.
12 From now on, when you till the ground, it won't yield its strength to you. You shall be a fugitive and a wanderer in the earth."
Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.”
13 Cain said to God, "My punishment is greater than I can bear.
Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.
14 Look, you have driven me out this day from the surface of the ground. I will be hidden from your face, and I will be a fugitive and a wanderer in the earth. It will happen that whoever finds me will kill me."
Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.”
15 And God said to him, "Not so. Whoever kills Cain vengeance will be taken on him sevenfold." And God appointed a sign for Cain, lest any finding him should strike him.
Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.
16 So Cain went out from the presence of God and lived in the land of Nod, east of Eden.
Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.
17 Cain had marital relations with his wife, and she conceived and gave birth to Enoch. He built a city and called the name of the city after the name of his son, Enoch.
Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.
18 To Enoch was born Irad, and Irad became the father of Mehaiiel, and Mehaiiel became the father of Methushael, and Methushael became the father of Lamech.
Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.
19 Lamech took two wives: the name of the one was Adah, and the name of the other Zillah.
Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.
20 Adah gave birth to Jabal, who was the father of those who dwell in tents and have livestock.
Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
21 His brother's name was Jubal, who was the father of all who play the harp and flute.
Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.
22 Zillah also gave birth to Tubal Cain, who heated metal and shaped instruments of bronze and iron. Tubal Cain's sister was Naamah.
Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama.
23 Lamech said to his wives, "Adah and Zillah, hear my voice. You wives of Lamech, listen to my speech, for I have slain a man for wounding me, a young man for bruising me.
Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.
24 If Cain will be avenged seven times, truly Lamech seventy-seven times."
Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.”
25 Adam had marital relations with his wife again, and she gave birth to a son, and named him Seth, saying, "For God has appointed me another child instead of Abel, for Cain killed him."
Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”
26 And a son was also born to Seth, and he named him Enosh. This one began to call on the name of God.
Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.

< Genesis 4 >