< Genesis 32 >

1 Jacob went on his way, and the angels of God met him.
Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
2 When he saw them, Jacob said, "This is God's camp." He called the name of that place Mahanaim.
Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
3 Jacob sent messengers ahead of him to Esau, his brother, to the land of Seir, the region of Edom.
Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
4 He commanded them, saying, "This is what you shall tell my lord, Esau: 'This is what your servant, Jacob, says. I have lived as a foreigner with Laban, and stayed until now.
O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
5 I have cattle, donkeys, flocks, male servants, and female servants. I have sent to tell my lord, that I may find favor in your sight.'"
Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’”
6 The messengers returned to Jacob, saying, "We came to your brother Esau. Not only that, but he comes to meet you, and four hundred men with him."
Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
7 Then Jacob was very afraid and was distressed. He divided the people who were with him, and the flocks, and the herds, and the camels, into two camps;
Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
8 and he said, "If Esau comes to the one camp, and strikes it, then the other camp will escape."
O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
9 Jacob said, "God of my father Abraham, and God of my father Isaac, who said to me, 'Return to your country, and to your relatives, and I will do you good,'
Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
10 I am not worthy of the least of all the loving kindnesses and of all the faithfulness which you have shown to your servant; for with just my staff I passed over this Jordan, and now I have become two camps.
Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
11 Please deliver me from the hand of my brother, from the hand of Esau: for I fear that he will come and attack me and the mothers with the children.
Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
12 You said, 'I will surely do you good and make your descendants as the sand of the sea, which can't be counted because there are so many.'"
Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
13 So he spent the night there and selected from what he had acquired a present for his brother Esau:
Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
14 two hundred female goats and twenty male goats, two hundred ewes and twenty rams,
Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ, iri mkpi abụọ, narị nne atụrụ abụọ, iri ebule abụọ
15 thirty milk camels with their young, forty cows, ten bulls, twenty female donkeys and ten male donkeys.
Iri nne ịnyịnya kamel atọ na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ, oke ehi iri, iri nne ịnyịnya ibu abụọ, oke ịnyịnya ibu iri.
16 He entrusted them into the hands of his servants as separate herds, and said to his servants, "Pass over before me, and keep some distance between the herds."
O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
17 He instructed the first, saying, "When Esau my brother meets you and asks you, saying, 'Whose are you? Where are you going? Whose are these ahead of you?'
O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
18 Then you shall say, 'They are your servant, Jacob's. It is a present sent to my lord Esau. And look, he also is behind us.'"
Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’”
19 He instructed also the second, and the third, and all that followed the herds, saying, "This is how you are to speak to Esau, when you find him.
Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
20 You shall say, 'Not only that, but look, your servant Jacob is behind us.'" For, he said, "I will appease him with the present that goes before me, and afterward I will meet him. Perhaps he will accept me."
Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
21 So the gift passed over before him, and he himself stayed that night in the camp.
Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
22 He got up that night and took his two wives, and his two female servants, and his eleven sons and crossed over the ford of the Jabbok.
Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
23 He took them and sent them across the stream, and sent over all his possessions.
Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
24 Then Jacob was left alone. And a man wrestled with him until the rising of the dawn.
Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
25 When he saw that he did not defeat him, he struck the socket of his hip, and Jacob's hip was dislocated as he wrestled with him.
Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
26 Then he said, "Let me go, for the dawn is breaking." But Jacob said, "I won't let you go unless you bless me."
Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
27 And he said to him, "What is your name?" He said, "Jacob."
Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
28 Then he said, "Your name will no longer be called Jacob, but Israel, because you have struggled with God and with men and have prevailed."
Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
29 Then Jacob asked him, "Please tell me your name." But he said, "Why is it that you ask what my name is?" And he blessed him there.
Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
30 So Jacob called the name of the place Peniel: "For I have seen God face to face, and my life has been preserved."
Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
31 The sun rose on him as he passed by Peniel, and he limped because of his hip.
Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
32 Therefore, to this day the children of Israel do not eat the tendon of the hip socket, because he struck Jacob's hip socket near that tendon.
Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.

< Genesis 32 >