< Psalms 118 >

1 Give thanks to YHWH, For [He is] good, for His kindness [is] for all time.
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2 Now let Israel say, His kindness [is] for all time.
Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
3 Now let the house of Aaron say, His kindness [is] for all time.
Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
4 Now let those fearing YHWH say, His kindness [is] for all time.
Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
5 I called YAH from the narrow place, YAH answered me in a broad place.
Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
6 YHWH [is] for me, I do not fear what man does to me.
Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
7 YHWH [is] for me among my helpers, And I look on those hating me.
Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
8 Better to take refuge in YHWH, Than to trust in man,
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
9 Better to take refuge in YHWH, Than to trust in princes.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
10 All nations have surrounded me, In the Name of YHWH I surely cut them off.
Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
11 They have surrounded me, Indeed, they have surrounded me, In the Name of YHWH I surely cut them off.
Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
12 They surrounded me as bees, They have been extinguished as a fire of thorns, In the Name of YHWH I surely cut them off.
Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
13 You have severely thrust me to fall, And YHWH has helped me.
Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
14 YAH is my strength and song, And He is to me for salvation.
Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
15 A voice of singing and salvation, [Is] in the tents of the righteous, The right hand of YHWH is doing valiantly.
Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
16 The right hand of YHWH is exalted, The right hand of YHWH is doing valiantly.
Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
17 I do not die, but live, And recount the works of YAH,
Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
18 YAH has severely disciplined me, And has not given me up to death.
Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
19 Open gates of righteousness to me, I enter into them—I thank YAH.
Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
20 This [is] the gate to YHWH, The righteous enter into it.
Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
21 I thank You, for You have answered me, And are to me for salvation.
Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
22 A stone the builders refused Has become head of a corner.
Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
23 This has been from YHWH, It [is] wonderful in our eyes,
nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
24 This [is] the day YHWH has made, We rejoice and are glad in it.
Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
25 Ah, now, O YHWH, please save, Ah, now, O YHWH, please prosper.
O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
26 Blessed [is] He who is coming In the Name of YHWH, We blessed you from the house of YHWH,
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
27 God [is] YHWH, and He gives light to us, Direct the festal-sacrifice with cords, To the horns of the altar.
Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
28 You [are] my God, and I confess You, My God, I exalt You.
Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
29 Give thanks to YHWH, For [He is] good, for His kindness [is] for all time!
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

< Psalms 118 >