< Psalms 100 >

1 A PSALM OF THANKSGIVING. Shout to YHWH, all the earth!
Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
2 Serve YHWH with joy, come before Him with singing.
Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
3 Know that YHWH [is] God, He made us, and we are His, His people—and the flock of His pasture.
Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
4 Enter His gates with thanksgiving, His courts with praise, Give thanks to Him, bless His Name.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.
5 For YHWH [is] good, His kindness [is] for all time, And His faithfulness to generation and generation!
Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.

< Psalms 100 >