< Amos 4 >

1 Hear this word, you cows of Bashan, Who [are] on the mountain of Samaria, Who are oppressing the poor, Who are bruising the needy, Who are saying to their lords: “Bring in, and we drink.”
Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
2 Lord YHWH has sworn by His holiness, “Behold, days are coming on you, And He has taken you away with hooks, And your posterity with fish-hooks.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
3 And [by] breaches you go forth, A woman before her, And you have cast down the high place,” A declaration of YHWH.
Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4 “Enter Beth-El, and transgress, At Gilgal multiply transgression, And bring in your sacrifices every morning, Your tithes every third year.
“Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla.
5 And burn a thank-offering with leaven as incense, And proclaim willing gifts, sound! For so you have loved, O sons of Israel,” A declaration of Lord YHWH.
Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6 “And I also—I have given to you cleanness of teeth in all your cities, And lack of bread in all your places, And you have not turned back to Me,” A declaration of YHWH.
“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
7 “And I also—I have withheld from you the rain, While yet three months to harvest, And I have sent rain on one city, And on another city I do not send rain, One portion is rained on, And the portion on which it does not rain withers.
“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
8 And two or three cities have wandered, To the same city to drink water, And they are not satisfied, And you have not turned back to Me,” A declaration of YHWH.
Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
9 “I have struck you with blasting and with mildew, The abundance of your gardens and of your vineyards, And of your figs, and of your olives, The palmer-worm eats, And you have not turned back to Me,” A declaration of YHWH.
“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
10 “I have sent among you pestilence by the way of Egypt, I have slain your choice ones by sword, With your captive horses, And I cause the stink of your camps to come up—Even into your nostrils, And you have not turned back to Me,” A declaration of YHWH.
“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
11 “I have overturned among you, Like the overturn by God of Sodom and Gomorrah, And you are as a brand delivered from a burning, And you have not turned back to Me,” A declaration of YHWH.
“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, ma unu alọghachikwuteghị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
12 “Therefore, thus I do to you, O Israel, at last, Because this I do to you, Prepare to meet your God, O Israel.”
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
13 For behold, the Former of mountains, and Creator of wind, And the Declarer to man what [is] His thought, He is making dawn obscurity, And is treading on high places of earth, YHWH, God of Hosts, [is] His Name!
Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

< Amos 4 >