< 1 John 4 >

1 Beloved, do not believe every spirit, but prove the spirits, if they are of God, because many false prophets have gone forth into the world.
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.
2 In this you know the Spirit of God: every spirit that confesses Jesus Christ having come in the flesh, it is of God,
Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke.
3 and every spirit that does not confess Jesus Christ having come in the flesh, it is not of God; and this is that of the antichrist, which you heard that it comes, and now it is already in the world.
Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa.
4 You are of God, little children, and you have overcome them; because greater is He who [is] in you, than he who is in the world.
Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
5 They are of the world, because they speak of this from the world, and the world hears them;
Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.
6 we are of God; he who is knowing God hears us; he who is not of God, does not hear us; from this we know the Spirit of truth and the spirit of error.
Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
7 Beloved, may we love one another, because love is of God, and everyone loving has been begotten of God, and knows God;
Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke.
8 he who is not loving did not know God, because God is love.
Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.
9 In this was revealed the love of God in us, because God has sent His only begotten Son into the world, that we may live through Him;
E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.
10 in this is love, not that we loved God, but that He loved us, and sent His Son [as] the propitiation for our sins.
Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
11 Beloved, if God so loved us, we also ought to love one another;
Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.
12 no one has ever seen God; if we may love one another, God remains in us, and His love is having been perfected in us;
O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.
13 in this we know that we remain in Him, and He in us, because of His Spirit He has given us.
O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
14 And we have seen and testify that the Father has sent the Son [as] Savior of the world;
Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.
15 whoever may confess that Jesus is the Son of God, God remains in him, and he in God;
Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.
16 and we have known and believed the love that God has in us; God is love, and he who is remaining in love, remains in God, and God in him.
Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
17 In this, love has been perfected with us, that we may have boldness in the day of judgment, because even as He is, we also are in this world.
Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a.
18 There is no fear in love, but perfect love casts out fear, because fear involves punishment, and he who is fearing has not been made perfect in love;
Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.
19 we love Him, because He first loved us;
Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.
20 if anyone may say, “I love God,” and may hate his brother, he is a liar; for he who is not loving his brother whom he has seen, how is he able to love God whom he has not seen?
Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya.
21 And this [is] the command we have from Him, that he who is loving God, may also love his brother.
Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”

< 1 John 4 >