< Zephaniah 3 >

1 Woe to her that is rebellious and polluted, to the oppressing city!
Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
2 She hearkened not to any voice; she accepted no correction; in the Lord she did not trust; to her God she drew not near.
Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3 Her princes in her midst are roaring lions: her judges are evening wolves, they leave not a bone for the morning.
Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
4 Her prophets are thoughtless men of treachery: her priests have profaned the sanctuary, they have done violence to the law.
Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
5 The just Lord is in her midst, he will not do wrong; morning after morning doth he bring his justice to the light [of day], it never faileth; but the unjust knoweth no shame.
Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
6 I have cut off nations; destroyed are their battlements; I have laid in ruins their streets, so that none passeth through; their cities are wasted, without a man, without an inhabitant.
“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
7 I said, Surely thou wilt fear me, thou wilt accept correction; so that her dwelling should not be cut off, all that I had decreed to bring over her; but they rose up early, they acted corruptly in all their doings.
Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
8 Therefore wait but for me, saith the Lord, for the day that I rise up to the prey; for my judgment [cometh] to gather the nations, for me to assemble the kingdoms, to pour over them my indignation, all the fierceness of my anger; for through the fire of my jealousy shall all the earth be devoured.
Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
9 Yea then will I change unto the people a pure language, that they may all call on the name of the Lord, to serve him with one accord.
“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
10 From beyond the rivers of Cush shall they bring my suppliants, even the assembly of my dispersed, as an offering unto me.
Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
11 On that day shalt thou not be ashamed because of all thy doings, whereby thou hast transgressed against me; for then will I remove out of the midst of thee those that rejoice in thy pride, and thou shalt never more be haughty again on my holy mount.
Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.
12 And I will leave remaining in the midst of thee a humble and poor people, and they shall trust in the name of the Lord.
Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.
13 The remnant of Israel shall not do injustice, nor speak lies; and there shall not be found in their mouth a deceitful tongue; for they shall feed and lie down, with none to make them afraid.
Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
14 Sing, O daughter of Zion; shout, O Israel; rejoice and be glad with all thy heart, O daughter of Jerusalem!
Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
15 The Lord hath removed thy punishment, he hath cleared away thy enemy: the king of Israel, the Lord, is in the midst of thee; thou shalt not see evil any more.
Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16 On that day shall it be said to Jerusalem, Fear thou not: [to] Zion, Let not thy hands become weak.
Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
17 The Lord thy God is in the midst of thee, the mighty one who will save; he will be glad over thee with rejoicing; he will be silent in his love, he will exult over thee with song.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
18 Those that mourn far away from the festive assembly do I gather, those that were separated from thee, [that have borne] for thee the burden of reproach.
“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
19 Behold, I will deal [severely] with all that afflict thee at that time: and I will save her that halteth, and her that was driven off will I gather; and I will render them a praise and a famous name on all the earth where they have been put to shame.
Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
20 At that time will I bring you back, even in the time that I gather you; for I will make you for a name and for a praise among all people of the earth, when I bring back again your captives before your eyes, saith the Lord.
Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

< Zephaniah 3 >