< Numbers 24 >

1 And when Bil'am saw that it was pleasing in the eyes of the Lord to bless Israel, he went not, as at other times, to seek for enchantments, but he set his face toward the wilderness.
Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.
2 And Bil'am lifted up his eyes, and when he saw Israel encamped according to their tribes, there came upon him the spirit of God.
Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
3 And he took up his parable, and said, Thus saith Bil'am the son of Beor, and thus saith the man whose eyes are open;
O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
4 Thus saith he who heareth the sayings of God, who seeth the vision of the Almighty, falling down, with unvailed eyes:
Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
5 How beautiful are thy tents, O Jacob, thy dwelling, O Israel!
“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6 As streams are they spread forth, as gardens by the river's side, as aloe-trees, which the Lord hath planted, as cedar-trees beside the waters.
“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
7 Water runneth out of His buckets, that his seed may be moistened by abundance of water; and exalted above Agag shall be his king, and raised on high shall be his kingdom.
Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
8 God, who brought him forth out of Egypt, is to him like the heights of the reem; he will devour nations, his oppressors, and their bones will he break, and pierce [them] through with his arrows.
“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
9 He coucheth, he lieth down as a lion, and as a lioness: who shall make him rise up? They that bless thee be blessed, and they that curse thee be cursed.
Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
10 And the anger of Balak was kindled against Bil'am, and he struck his hands together: and Balak said unto Bil'am, To denounce my enemies did I call thee, and, behold, thou hast even blessed them these three times.
Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
11 And now flee thou to thy place: I thought to honor thee greatly; but, lo, the Lord hath kept thee back from honor.
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12 And Bil'am said unto Balak, Did I not already speak to thy messengers, whom thou sentest unto me, saying,
Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
13 If Balak would give me his house full of silver and gold, I could not transgress the order of the Lord, to do good or evil out of my own heart: what the Lord will speak, that must I speak?
‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
14 And now, behold, I am going unto my people: come, I will advise thee against what this people will do to thy people in the end of days.
Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
15 And he took up his parable and said, Thus saith Bil'am the son of Beor, and thus saith the man whose eyes are open;
Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
16 Thus saith he who heareth the sayings of God, and knoweth the knowledge of the Most High, who seeth the vision of the Almighty, falling down, with unvailed eyes:
amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
17 I see him, but not now; I behold him, but not nigh; there steppeth forth a star out of Jacob, and there ariseth a sceptre out of Israel, and he pierceth the chiefs of Moab, and destroyeth all the children of Sheth.
“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
18 And Edom shall be a conquest, and Seir shall be a conquest for his enemies; and Israel shall do valiantly.
A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
19 And there shall rule the one from Jacob, and he shall destroy whatever escapeth out of the city.
Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
20 And he looked on Amalek, and he took up his parable, and said, The first of nations is Amalek; but his latter end shall be destruction for ever.
Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
21 And he looked on the Kenites, and took up his parable, and said, Strong is thy dwelling-place, and placed on the rock is thy nest.
Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
22 Nevertheless the Kenite shall be wasted: whither will Asshur carry thee away captive?
Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”
23 And he took up his parable, and said, Alas, who shall live when God doth appoint this one?
Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?
24 But ships will come from the coast of Kittim, and will afflict Asshur, and will afflict 'Eber; and he also will be given to destruction for ever.
Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”
25 And Bil'am rose up, and went and returned to his place; and Balak also went his way.
Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

< Numbers 24 >