< Job 3 >

1 After this time Job opened his mouth, and cursed his day.
Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
2 And Job commenced, and said,
Job sịrị:
3 Oh that the day whereon I was born might perish, and the night when it was said, There hath been a male child conceived.
“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
4 May that day be [covered with] darkness; may not God from above inquire for it, and may no light beam upon it.
Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
5 Oh that darkness and the shadow of death might defile it; may a cloud rest upon it; may the blackness of the day terrify it.
Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
6 Yon night — let darkness seize upon it; let it not be united to the days of the year; let it not come into the number of the [periods lighted by the] moon.
Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
7 Lo, may that night be solitary, let no song of joy occur thereon.
Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
8 Let those denounce it that curse the day, who are ready to raise up their mourning cry.
Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
9 Let the stars of its twilight be darkened; let it hope for light, and there be none; and let it not behold the eyelids of the morning-dawn;
Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
10 Because God closed not against me the doors of the womb, and thus concealed trouble from my eyes.
nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
11 Why did I not die [the moment I issued] from the womb, and [why] was I not born merely to perish at once?
“Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m, kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
12 Wherefore were knees ready to receive me? and for what purpose were breasts there that I might suck?
Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m? Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
13 For now should I be lying still and be quiet; I should sleep: then would I be at rest,
Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo; agaara m anọ nʼụra na izuike,
14 With kings and counsellors of the earth, who build up ruined places for themselves;
mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa, ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
15 Or with princes possessing gold, who fill their houses with silver;
mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
16 Or as an untimely birth, hidden [from view] I should not exist; as infants that never have seen the light;
Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
17 There [where] the wicked cease from troubling; and where the exhausted weary are at rest;
Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
18 [Where] the prisoners repose together, [and] they hear no more the taskmaster's voice.
Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
19 The small with the great is there, and the servant free from his master.
Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
20 Wherefore giveth He now light to the labor-laden, and life unto the bitter in soul?
“Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
21 Who wait for death, which [cometh] not; and who dig for it sooner than for hidden treasures;
Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
22 Who would rejoice even to exulting, who would be glad could they but find a grave?
ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
23 [Why is light given] to a man whose way is hidden, and around whom God hath placed a fence?
Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
24 For before my food cometh my groaning, and like the water are poured forth my loud complaints.
Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
25 Because what I greatly dreaded is come upon me, and what I apprehended is come unto me.
Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
26 I have had no safety, and no quiet, and no rest; and [now] harrowing trouble is come.
Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ, enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”

< Job 3 >