< Isaiah 63 >

1 Who is this that cometh from Edom, dyed red in his garments from Bozrah? this—glorious in his apparel, moving along in the greatness of his strength? “I who speak in righteousness, mighty to save.”
Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa, onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara? Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma, onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume, onye dị ike ịzọpụta!”
2 Why is redness on thy apparel, and [why are] thy garments as of one that treadeth the wine-press?
Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị?
3 “I have trodden the vat alone, and of the nations there was no man with me; and I trod them down in my anger, and I trampled on them in my fury; and their blood was sprinkled on my garments, and all my raiments have I stained.
“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.
4 For the day of vengeance was in my heart, and the year of my redeemed was come.
Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
5 And I looked, and there was no one to help, and I was astonished, and there was no one to support; and then my own arm aided me, and my fury—this it was that upheld me.
Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
6 And I stamped down nations in my anger, and I made them drunken with my fury, and brought down to the earth their victorious strength.”
Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
7 The kindnesses of the Lord will I mention, the praises of the Lord, in accordance with all that the Lord hath bestowed on us, and the abundant goodness toward the house of Israel, which he hath bestowed on them according to his mercies, and the abundance of his kindnesses.
Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
8 And he said, Surely they are my people, children that will not lie; and he became to them a Saviour.
Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
9 In all their affliction he was afflicted, and the angel of his presence saved them; in his love and in his pity he redeemed them; and he bore them, and he carried them all the days of old.
Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
10 But they rebelled, and grieved his holy Spirit; and he changed himself to become their enemy, and he fought against them.
Ma ha nupuru isi megide ya, meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ. Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha, lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.
11 Then remembered his people the ancient days of Moses, Where is he that brought them up out of the sea with the shepherd of his flock? where is he that put within him his holy Spirit?
Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga, ụbọchị Mosis na ndị nke ya. Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta, ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya? Olee ebe onye ahụ tinyere Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.
12 That displayed by the right hand of Moses his glorious arm; that divided the water before them, to make unto himself an everlasting name?
Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?
13 That led them through the deeps, as a horse through the wilderness, that they should not stumble?
Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi? Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara, ike agwụghị ha.
14 As a beast goeth down into the valley, so did the spirit of the Lord bring them to rest; thus didst thou guide thy people, to make unto thyself a glorious name.
Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.
15 Look down from heaven, and behold, from the habitation of thy holiness and of thy glory: where are thy zeal and thy mights, the yearning of thy bowels and of thy mercy which are now restrained from me?
Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?
16 For thou art our father; for Abraham knoweth nothing of us, and Israel recogniseth us not: thou, O Lord, art our father, our Redeemer from everlasting is thy name.
Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
17 Why hast thou let us go astray, O Lord, from thy ways, suffered our heart to be hardened against thy fear? Return for the sake of thy servants, the tribes of thy heritage.
Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.
18 But a brief space were thy holy people in possession, when our adversaries trod down thy sanctuary.
Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị, ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị.
19 We are become as though we are those over whom thou hast never ruled, over whom thy name hath not been called.
Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie, ma ị naghị achị nʼebe ha nọ, ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị.

< Isaiah 63 >