< Isaiah 5 >

1 I will sing now for my beloved, the song of my dear one touching his vineyard. A vineyard had my beloved on a rich hill-top;
Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
2 And he fenced it in, and cleared it of stones, and planted it with the choicest vines, and built a tower in its midst, and also a winepress he hewed out therein: and he hoped that it should bring forth grapes, and it brought forth worthless fruit.
O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
3 And now, O inhabitants of Jerusalem, and men of Judah, judge, I pray you, between me and my vineyard.
“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4 What more was to be done to my vineyard, that I had not done in it? Why then did I hope that it should bring forth grapes, while it brought forth worthless fruit?
Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
5 And now I will let you know also what I will do to my vineyard: I will take away its hedge, and it shall be eaten off; I will break down its wall, and it shall be trodden down;
Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
6 And I will lay it quite waste; it shall not be pruned, nor hoed around; and it shall be overgrown with briers and thorns; and the clouds will I command that they send down no rain upon it.
Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
7 For the vineyard of the Lord of hosts is the house of Israel, and the men of Judah are the plant of his delight: and he hoped for justice, but behold injustice; for equity, but behold iniquity.
Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
8 Woe unto those that cause house to join on house, bring field near to field, till there is no more room, so that ye may be left alone as the inhabitants in the midst of the land!
Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
9 In my ears [spoke] the Lord of hosts, Truly many houses shall become desolate, yea, great and beautiful ones without an inhabitant.
Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10 Yea, ten acres of vineyard shall yield [but] one bath, and a chomer-seed shall yield [but] an ephah.
Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
11 Woe unto those that rise up early in the morning, that they may run after strong drink; that continue until late in the twilight, till wine inflame them!
Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
12 And there are harp and psaltery, tambourine and flute, and wine at their drinking-feasts; but the deeds of the Lord they regard not, and the works of his hands they behold not.
Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13 Therefore are my people led into exile, for want of knowledge: and their honorable men suffer of famine, and their multitude are panting with thirst.
Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
14 Therefore hath the deep enlarged her desire, and opened her mouth without measure: and there descend [Jerusalem's] glory, and her multitude, and her noise, and whoever rejoiced therein. (Sheol h7585)
Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. (Sheol h7585)
15 And bent down shall be the son of earth, and humbled shall be the man, and the eyes of the lofty shall be humbled;
Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
16 And the Lord of hosts shall be exalted in judgment, and the holy God shall be sanctified by [displaying his] righteousness.
Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
17 Then shall the sheep feed according to their wont, and the ruins of the fat ones shall sojourners eat.
Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.
18 Woe unto those that draw iniquity with the cords of falsehood, and as with a wagon-rope, sinfulness;
Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
19 That say, Let him make speed, let him hasten his work, that we may see it: and let draw nigh and come the counsel of the Holy One of Israel, that we may know it!
Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”
20 Woe unto those that say of the evil it is good, and of the good it is evil; that put darkness for light, and light for darkness; that put bitter for sweet, and sweet for bitter!
Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
21 Woe unto those that are wise in their own eyes, and intelligent in their own esteem!
Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
22 Woe unto those that are heroes to drink wine, and men of might to mingle strong drink;
Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
23 Who justify the wicked in lieu of a bribe, and who deprive the righteous of their right!
ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.
24 Therefore as the tongue of the fire devoureth the stubble, and dry hay sinketh before the flame: so shall their root be as rotten things, and their blossom shall fly up as the dust; because they have despised the law of the Lord of hosts, and the word of the Holy One of Israel they have rejected.
Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
25 For this cause is kindled the anger of the Lord against his people, and he stretcheth forth his hand against them, and he smiteth them; and the mountains tremble, and their carcasses lie like sweepings in the midst of the streets: with all this his anger is not turned away, but still is his hand stretched out.
Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
26 And he will lift up an ensign to the nations from afar, and will call for one of them from the end of the earth; and, behold, with speed, swiftly, it cometh;
Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
27 There is none weary, nor stumbling among its men; it slumbereth not, it sleepeth not; not loosened is the girdle of its loins, not broken is the latchet of its shoes;
Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.
28 Whose arrows are sharpened, and all whose bows are bent; its horses hoofs are hard like the flint, and its wheels like the whirlwind;
Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
29 It hath a roar like the lioness, it roareth like the young lions: yea, it growleth, and layeth hold of the prey, and carrieth it safely off, with none to deliver.
Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
30 And it will rage against them on that day like with the raging of the sea: and if one look unto the earth, behold, there is darkness, oppression, and the light is darkened through the darkness of its clouds.
Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya dịka mbigbọ nke oke osimiri. A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya, ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu, ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.

< Isaiah 5 >