< Genesis 46 >

1 And Israel commenced his journey with all that he had, and came to Beer-sheba, and offered sacrifices unto the God of his father Isaac.
Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik.
2 And God spoke unto Israel in the visions of the night, and said, Jacob, Jacob. And he said, Here am I.
Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
3 And he said, I am God, the God of thy father; fear not to go down into Egypt; for a great nation will I make of thee there:
Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.
4 I will go down with thee into Egypt; and I will also surely bring thee up again; and Joseph shall put his hand upon thy eyes.
Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.”
5 And Jacob rose up from Beer-sheba: and the sons of Israel carried Jacob their father, and their little ones, and their wives, in the wagons which Pharaoh had sent to carry him.
Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya.
6 And they took their cattle and their goods, which they had gotten in the land of Canaan, and came into Egypt; Jacob, and all his seed with him:
Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so.
7 His sons, and his son's sons with him, his daughters, and his sons' daughters, and all his seed he brought with him into Egypt.
Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt.
8 And these are the names of the children of Israel, that came into Egypt, Jacob and his sons: the first-born of Jacob, Reuben.
Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb
9 And the sons of Reuben: Chanoch, and Pallu, and Chezron, and Carmi.
Ụmụ ndị ikom Ruben bụ, Hanok, na Palu, na Hezrọn na Kami.
10 And the sons of Simeon: Yemuel, and Yamin, and Ohad, and Yachin, and Zochar, and Shaul the son of the Canaanitish woman.
Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul. Nne Shaul bụ nwanyị Kenan.
11 And the sons of Levi: Gershon, Kehath, and Merari.
Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọn, na Kohat, na Merari.
12 And the sons of Judah: 'Er, and Onan, and Shelah, and Perez, and Zerach; but 'Er and Onan died in the land of Canaan, and the sons of Perez were Chezron and Chamul.
Ụmụ ndị ikom Juda bụ, Ịa, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera. Ma Ịa na Onan nwụrụ nʼala Kenan. Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
13 And the sons of Issachar: Tola, and Puvah, and Yob, and Shimron.
Ma ụmụ ndị ikom Isaka bụ, Tola, na Puva, na Jashub, na Shịmrọn.
14 And the sons of Zebulun: Sered, and Elon, and Yachleel.
Ụmụ ndị ikom Zebụlọn bụ, Sered, na Elọn, na Jaliil.
15 These are the sons of Leah, whom she bore unto Jacob in Padan-aram, with Dinah his daughter: all the souls of his sons and his daughters were thirty and three.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Lịa mụụrụ Jekọb nʼala Padan Aram. Ọ mụtakwara otu nwanyị aha ya bụ Daịna. Ụmụ ndị ikom na ndị inyom ndị a dị iri atọ na atọ.
16 And the sons of Gad: Ziphyon, and Chaggi, Shuni, and Ezbon, 'Eri, and Arodi, and Areli.
Ụmụ ndị ikom Gad bụ, Zefọn, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi na Areli.
17 And the sons of Asher: Yimnah, and Yishvah, and Yishvi, and Beriah, and Serach their sister; and the sons of Beriah: Cheber, and Malkiel.
Ụmụ ndị ikom Asha bụ, Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera. Ụmụ Beriya bụ, Heba na Malkiel.
18 These are the sons of Zilpah, whom Laban gave to Leah his daughter, and she bore these unto Jacob, sixteen souls.
Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ.
19 The sons of Rachel, Jacob's wife: Joseph and Benjamin.
Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.
20 And there were born unto Joseph in the land of Egypt Menasseh and Ephraim, whom Assenath the daughter of Poti-phera', the priest of On, bore unto him.
Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.
21 And the sons of Benjamin: Bela', and Becher, and Ashbel, Gera, and Naaman, Echi, and Rosh, Muppim and Chuppim, and Ard.
Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ, Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad.
22 These are the sons of Rachel, that were born to Jacob: in all fourteen souls.
Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ.
23 And the son of Dan: Chushim.
Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ, Hushim.
24 And the sons of Naphtali: Yachzeel, and Guni, and Yezer, and Shillem.
Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ, Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem.
25 These are the sons of Bilhah, whom Laban gave unto Rachel his daughter, and she bore these unto Jacob, in all seven souls.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa.
26 All the souls that came with Jacob into Egypt, that came out of his loins, besides the wives of Jacob's sons, were in all sixty and six souls.
Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii.
27 And the sons of Joseph, who were born him in Egypt, were two souls; all the souls of the house of Jacob, that came into Egypt, were seventy.
Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa.
28 And Judah he sent before him unto Joseph, to direct him beforehand unto Goshen; and they came into the land of Goshen.
Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,
29 And Joseph made ready his chariot, and went up to meet Israel his father, to Goshen; and when he obtained sight of him, he fell on his neck, and wept on his neck a good while.
Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge.
30 And Israel said unto Joseph, Let me die now, since I have seen thy face, that thou art yet alive.
Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”
31 And Joseph said unto his brothers, and unto his father's house, I will go up, and tell Pharaoh, and say unto him, My brothers and my father's house, who were in the land of Canaan, are come unto me;
Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m.
32 And the men are shepherds, for they have been owners of cattle; and their flocks, and their herds, and all that they have, they have brought along.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’
33 And it shall come to pass, if Pharaoh should have you called, and say, What is your occupation?
Ya mere, ọ bụrụ na Fero akpọ unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ ọrụ aka unu?’
34 That ye shall say, Owners of cattle have thy servants been from our youth even until now, both we, as also our fathers; in order that ye may dwell in the land of Goshen; for every shepherd is an abomination unto the Egyptians.
Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”

< Genesis 46 >