< Ezekiel 17 >

1 And the word of the Lord came unto me, saying,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Son of man, put forth a riddle, and propound a parable unto the house of Israel;
“Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ.
3 And say, Thus hath said the Lord Eternal, The great eagle with large wings, long winged, full of feathers, who is rich in many colors, came unto the Lebanon, and took the highest branch of the cedar:
Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.
4 The topmost of its young twigs did he crop off, and carry it into the traders' land; and he set it in a city of merchants.
Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.
5 And he took some of the seed of the land, and planted it in a fruitful field: he placed it by great waters, he transplanted it among the willow-trees.
“‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
6 And it grew, and became a trailing vine of low stature, the tendrils of which should turn toward him, and the roots of which should be under him: so it became a vine, and brought forth branches, and sent out shoots.
Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.
7 There was also another great eagle with large wings and many feathers: and, behold, this vine did bend its roots famishing toward him, and shot forth its tendrils toward him, that he might water it, from the beds where it was planted;
“‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri.
8 [Although] it was planted in a good field by great waters, that it might produce boughs, and that it might bear fruit, that it might become an elegant vine.
A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
9 Say now, Thus hath said the Lord Eternal, Shall it prosper? Behold the other will pull up its roots, and its fruit will he cut away, that it may dry up; every one of its growing leaves shall dry up; and not with great power and numerous people [will he have to come] to tear it away from its roots.
“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.
10 Yea, behold, although it is planted, shall it prosper? Lo, as soon as the east wind toucheth it, shall it be utterly dried up: in the beds where it groweth shall it dry up.
A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’”
11 And the word of the Lord came unto me, saying,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
12 Do now say to the rebellious family, Know ye not what these things mean? Say, Behold, the king of Babylon came to Jerusalem, and took away its king and its princes, and he brought them unto himself to Babylon;
“Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.
13 And he took one of the royal seed, and made a covenant with him, and bound him with an oath; but the mighty of the land did he take away;
O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.
14 That the kingdom should be debased, so as not to lift itself up; that it should keep his covenant that it might continue to exist.
Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ.
15 But he rebelled against him by sending his messengers into Egypt, that they might give him horses and numerous people. Shall he prosper? shall he escape that doth such things? yea, he hath broken the covenant, and shall he escape?
Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?
16 As I live, saith the Lord Eternal, surely in the residence of the king that hath made him king, whose oath he hath despised, and whose covenant he hath broken, even near him in the midst of Babylon shall he die.
“‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
17 And not with a mighty army and a large assembly shall Pharaoh labor for him in the war, when [the other] casteth up mounds, and buildeth works of attack, to cut off many souls.
Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
18 Yea, he that hath despised the oath by breaking the covenant, when, lo, he had given his hand, and hath done all these things, shall not escape.
O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
19 Therefore thus hath said the Lord Eternal, As I live, surely my oath that he hath despised, and my covenant that he hath broken, —even this will I bring upon his own head.
“‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
20 And I will spread my net over him, and he shall be caught in my snare, and I will bring him to Babylon, and will hold judgment with him there for his trespass which he hath committed against me.
Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.
21 And all his fugitives with all the wings of his army shall fall by the sword, and those that remain shall be dispersed toward all winds: and ye shall know that I the Lord have spoken it.
Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
22 Thus hath said the Lord Eternal, But I myself will take [a part] of the highest branch of the high cedar, and will preserve it; from the topmost of its young twigs will I crop off a tender one, and I myself will plant it firmly upon a high and eminent mountain:
“‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.
23 On the mountain of the height of Israel will I plant it firmly; and it shall produce boughs, and bear fruit, and become an elegant cedar; and there shall dwell under it all fowls, every thing that hath wing; in the shadow of its light branches shall they dwell.
Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.
24 And all the trees of the field shall know that I the Lord have made low the high tree, have made high the lowly tree, that I have dried up the green tree, and have caused to flourish the dry tree: I the Lord have spoken and have done it.
Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’”

< Ezekiel 17 >