< Esther 2 >

1 After these events, when the fury of king Achashverosh was appeased, he remembered Vashti, and what she had done, and what had been decreed concerning her.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya.
2 Thus said the king's young men, his servants, Let there be sought for the king virgins handsome in appearance;
Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya.
3 And let the king appoint officers in all the provinces of his kingdom, that they may gather together all the young virgins, handsome in appearance, unto Shushan the capital, into the house of the women, under the custody of Hege the king's chamberlain, the keeper of the women; and let them give them their customary anointings;
Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.
4 And let the maiden who may be pleasing in the eyes of the king become queen instead of Vashti: and the speech was pleasing in the eyes of the king, and he did so.
Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe.
5 There was a certain Jew in Shushan the capital, whose name was Mordecai, the son of Yair, the son of Shim'i, the son of Kish, a Benjamite;
Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin.
6 Who had been carried away into exile from Jerusalem with the exiles who had been exiled with Jeconyah, the king of Judah, whom Nebuchadnezzar the king of Babylon had carried into exile.
Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha.
7 And he had brought up Hadassah, that is Esther, the daughter of his uncle; for she had neither father nor mother, and the maiden was beautiful in form and handsome in appearance; and when her father and mother were dead, Mordecai had taken her to himself as a daughter.
Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị.
8 And it came to pass, when the king's order and his decree were heard, and when many maidens were brought together unto Shushan the capital, under the custody of Hegai, that Esther also was brought unto the king's house, under the custody of Hegai, the keeper of the women.
Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze.
9 And the maiden was pleasing in his eyes, and she obtained favor before him; and he made haste to give her her anointings, with her presents, and the seven maidens, who were selected to be given her, out of the king's house: and he preferred her and her maidens with the best things in the house of the women.
Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.
10 Esther told nothing of her people or of her descent; for Mordecai had charged her that she should not tell.
Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.
11 And day by day did Mordecai walk before the court of the house of women, to ascertain the well-being of Esther, and what would be done with her.
Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.
12 And when the turn of every maiden was come to go in unto king Achashverosh, at the expiration [of the time] that she had been treated according to the custom of the women, twelve months; for so were the days of their anointings accomplished, six months with the oil of myrrh, and six months with sweet odors, and with other ointments of the women;
Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ.
13 And thus came the maiden unto the king; [and] whatsoever she asked for was given her to go with her out of the house of the women as far as the house of the king.
Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze.
14 In the evening she went, and in the morning she returned unto the second house of the women, to the custody of Sha'ashgas, the king's chamberlain, the keeper of the concubines: she used not to come again unto the king, except the king desired for her, and she was called by name.
A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ.
15 And when the turn of Esther, the daughter of Abichayil, the uncle of Mordecai, who had taken her to himself as a daughter, was come to go in unto the king, she required nothing but what Hegai the king's chamberlain, the keeper of the women, said: and Esther obtained grace in the eyes of all those that beheld her.
Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya.
16 And Esther was taken unto king Achashverosh, unto his royal house, in the tenth month, which is the month Tebeth, in the seventh year of his reign.
E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.
17 And the king loved Esther above all the women, and she obtained grace and favor before him more than all the virgins; and he placed the royal crown upon her head, and made her queen instead of Vashti.
Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti.
18 And the king made a great feast unto all his princes and his servants, the feast of Esther; and he made a release of taxes to the provinces, and gave presents, according to the ability of the king.
Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime.
19 And when virgins were gathered together the second time, then was Mordecai sitting in the king's gate.
Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze.
20 [But] Esther had not yet told of her descent nor her people; as Mordecai had charged her; and Esther did [fulfill] the order of Mordecai, equally as when she was under his guardianship.
Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.
21 In those days, while Mordecai was sitting in the king's gate, Bigthan and Theresh, two chamberlains of the king, of those who kept the door, became wroth, and sought to lay [their] hand on king Achashverosh.
Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses.
22 And the thing became known to Mordecai, and he told it unto Esther the queen; and Esther said it to the king in the name of Mordecai.
Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya.
23 And the thing was inquired into and found true; and they were both of them hanged on a gallows; and it was written in the book of chronicles before the king.
Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.

< Esther 2 >