< Nehemiah 12 >

1 Now these [are] the priests and the Levites that went up with Zorobabel the son of Salathiel and Jesus: Saraia, Jeremia, Esdra,
Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta. Seraya, Jeremaya, Ezra,
2 Amaria, Maluch,
Amaraya, Maluk, Hatush,
3 Sechenia.
Shekanaya, Rehum, Meremot,
4
Ido, Gineton, Abija
5
Mijamin, Maadaya, Bilga,
6
Shemaya, Joiarib, Jedaya,
7 These [were] the chiefs of the priests, and their brethren in the days of Jesus.
Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya. Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua.
8 And the Levites [were], Jesus, Banui, Cadmiel, Sarabia, Jodae, Matthania: he [was] over the bands,
Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele.
9 and his brethren [were appointed] to the daily courses.
Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.
10 And Jesus begot Joakim, and Joakim begot Eliasib, and Eliasib [begot] Jodae,
Jeshua mụrụ Joiakim, Joiakim mụrụ Eliashib, Eliashib mụrụ Joiada,
11 and Jodae begot Jonathan, and Jonathan begot Jadu.
Joiada mụrụ Jonatan, ebe Jonatan mụrụ Jadua.
12 And in the days of Joakim, his brethren the priests and the heads of families [were, belonging] to Saraia, Amaria; to Jeremia, Anania;
Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim. Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya, Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya,
13 to Esdra, Mesulam; to Amaria, Joanan;
Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra, Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya;
14 to Amaluch, Jonathan; to Sechenia, Joseph;
Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk; Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya;
15 to Are, Mannas; to Marioth, Elcai;
nke Harim, Adna, nke Meremot, Helkai;
16 to Adadai, Zacharia; to Ganathoth, Mesolam;
Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido; Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton
17 to Abia, Zechri; to Miamin, Maadai; to Pheleti, [one];
Zikri, onyeisi ụmụ Abija; Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin
18 to Balgas, Samue; to Semia, Jonathan;
Shamua, onyeisi ụmụ Bilga, Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya;
19 to Joarib, Matthanai; to Edio, Ozi;
Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib; Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya;
20 to Salai, Callai; to Amec, Abed;
Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok,
21 to Elkia, Asabias; to Jedeiu, Nathanael.
Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya.
22 The Levites in the days of Eliasib, Joada, and Joa, and Joanan, and Idua, [were] recorded heads of families: also the priests, in the reign of Darius the Persian.
E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.
23 And the sons of Levi, heads of families, [were] written in the book of the chronicles, even to the days of Joanan son of Elisue.
E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.
24 And the heads of the Levites [were] Asabia, and Sarabia, and Jesu: and the sons of Cadmiel, and their brethren over against them, were to sing hymns of praise, according to the commandment of David the man of God, course by course.
Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.
25 When I gathered the porters,
Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.
26 [it was] in the days of Joakim son of Jesus, son of Josedec, and in the days of Neemia: and Esdras the priest [was] scribe.
Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.
27 And at the dedication of the wall of Jerusalem they sought the Levites in their places, to bring them to Jerusalem, to keep a feast of dedication and gladness with thanksgiving, and they sounded cymbals with songs, and [had] lutes and harps.
Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
28 And the sons of the singers were assembled both from the neighbourhood round about to Jerusalem, and from the villages,
Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,
29 and from the country: for the singers built themselves villages by Jerusalem.
na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem.
30 And the priests and the Levites purified themselves, and they purified the people, and the porters, and the wall.
Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.
31 And they brought up the princes of Juda on the wall, and they appointed two great [companies] for thanksgiving, and they passed on the right hand on the wall of the dung-gate.
E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.
32 And after them went Osaia, and half the princes of Juda,
Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ,
33 and Azarias, and Esdras, and Mesollam,
ha na Azaraya, Ezra, Meshulam,
34 and Juda, and Benjamin, and Samaias and Jeremia.
Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya
35 And [some] of the sons of the priest with trumpets, Zacharias son of Jonathan, son of Samaias, son of Matthania, son of Michaia, son of Zacchur, son of Asaph:
na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.
36 and his brethren, Samaia, and Oziel, Gelol, Jama, Aia, Nathanael, and Juda, Anani, to praise with the hymns of David the man of God; and Esdras the scribe [was] before them,
Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha.
37 at the gate, to praise before them, and they went up by the steps of the city of David, in the ascent of the wall, above the house of David, even to the water-gate
Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
39 of Ephraim, and to the fish-gate, and by the tower of Anameel, and as far as the sheep-gate.
Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.
Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu,
tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha.
42 And the singers were heard, and were numbered.
Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya.
43 And in that day they offered great sacrifices, and rejoiced; for God had made them very joyful: and their wives and their children rejoiced: and the joy in Jerusalem was heard from afar off.
Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya.
44 And in that day they appointed men over the treasuries, for the treasures, the first fruits, and the tithes, and [for] the chiefs of the cities who were assembled among them, [to furnish] portions for the priests and Levites: for [there was] joy in Juda over the priests and over the Levites that waited.
Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.
45 And they kept the charges of their God, and the charges of the purification, and [ordered] the singers and the porters, according to the commandments of David and his son Solomon.
Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.
46 For in the days of David Asaph was originally first of the singers, and [they sang] hymns and praise to God.
Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
47 And all Israel in the days of Zorobabel, and in the days of Neemias, gave the portions of the singers and the porters, a daily rate: and consecrated them to the Levites: and the Levites consecrated them to the sons of Aaron.
Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.

< Nehemiah 12 >