< Isaiah 51 >

1 Hearken to me, ye that follow after righteousness, ye that seek the LORD: look unto the rock [whence] ye are hewn, and to the hole of the pit [whence] ye are digged.
Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
2 Look unto Abraham your father, and unto Sarah [that] bare you: for I called him alone, and blessed him, and increased him.
Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
3 For the LORD shall comfort Zion: he will comfort all her waste places; and he will make her wilderness like Eden, and her desert like the garden of the LORD; joy and gladness shall be found therein, thanksgiving, and the voice of melody.
Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
4 Hearken unto me, my people; and give ear unto me, O my nation: for a law shall proceed from me, and I will make my judgment to rest for a light of the people.
Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
5 My righteousness [is] near; my salvation is gone forth, and mine arms shall judge the people; the isles shall wait upon me, and on mine arm shall they trust.
Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha.
6 Lift up your eyes to the heavens, and look upon the earth beneath: for the heavens shall vanish away like smoke, and the earth shall wax old like a garment, and they that dwell therein shall die in like manner: but my salvation shall be for ever, and my righteousness shall not be abolished.
Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
7 Hearken unto me, ye that know righteousness, the people in whose heart [is] my law; fear ye not the reproach of men, neither be ye afraid of their revilings.
Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.
8 For the moth shall eat them up like a garment, and the worm shall eat them like wool: but my righteousness shall be for ever, and my salvation from generation to generation.
Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
9 Awake, awake, put on strength, O arm of the LORD; awake, as in the ancient days, in the generations of old. [Art] thou not it that hath cut Rahab, [and] wounded the dragon?
Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
10 [Art] thou not it which hath dried the sea, the waters of the great deep; that hath made the depths of the sea a way for the ransomed to pass over?
Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?
11 Therefore the redeemed of the LORD shall return, and come with singing unto Zion; and everlasting joy [shall be] upon their head: they shall obtain gladness and joy; [and] sorrow and mourning shall flee away.
Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
12 I, [even] I, [am] he that comforteth you: who [art] thou, that thou shouldest be afraid of a man [that] shall die, and of the son of man [which] shall be made [as] grass;
“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
13 And forgettest the LORD thy maker, that hath stretched forth the heavens, and laid the foundations of the earth; and hast feared continually every day because of the fury of the oppressor, as if he were ready to destroy? and where [is] the fury of the oppressor?
na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
14 The captive exile hasteneth that he may be loosed, and that he should not die in the pit, nor that his bread should fail.
Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha.
15 But I [am] the LORD thy God, that divided the sea, whose waves roared: The LORD of hosts [is] his name.
Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
16 And I have put my words in thy mouth, and I have covered thee in the shadow of mine hand, that I may plant the heavens, and lay the foundations of the earth, and say unto Zion, Thou [art] my people.
Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’”
17 Awake, awake, stand up, O Jerusalem, which hast drunk at the hand of the LORD the cup of his fury; thou hast drunken the dregs of the cup of trembling, [and] wrung [them] out.
Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
18 [There is] none to guide her among all the sons [whom] she hath brought forth; neither [is there any] that taketh her by the hand of all the sons [that] she hath brought up.
Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.
19 These two [things] are come unto thee; who shall be sorry for thee? desolation, and destruction, and the famine, and the sword: by whom shall I comfort thee?
Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?
20 Thy sons have fainted, they lie at the head of all the streets, as a wild bull in a net: they are full of the fury of the LORD, the rebuke of thy God.
Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
21 Therefore hear now this, thou afflicted, and drunken, but not with wine:
Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
22 Thus saith thy Lord the LORD, and thy God [that] pleadeth the cause of his people, Behold, I have taken out of thine hand the cup of trembling, [even] the dregs of the cup of my fury; thou shalt no more drink it again:
Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
23 But I will put it into the hand of them that afflict thee; which have said to thy soul, Bow down, that we may go over: and thou hast laid thy body as the ground, and as the street, to them that went over.
Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”

< Isaiah 51 >