< Exodus 31 >

1 And the LORD spake unto Moses, saying,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 See, I have called by name Bezaleel the son of Uri, the son of Hur, of the tribe of Judah:
“Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,
3 And I have filled him with the spirit of God, in wisdom, and in understanding, and in knowledge, and in all manner of workmanship,
emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche,
4 To devise cunning works, to work in gold, and in silver, and in brass,
ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
5 And in cutting of stones, to set [them], and in carving of timber, to work in all manner of workmanship.
ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.
6 And I, behold, I have given with him Aholiab, the son of Ahisamach, of the tribe of Dan: and in the hearts of all that are wise hearted I have put wisdom, that they may make all that I have commanded thee;
Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:
7 The tabernacle of the congregation, and the ark of the testimony, and the mercy seat that [is] thereupon, and all the furniture of the tabernacle,
“ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,
8 And the table and his furniture, and the pure candlestick with all his furniture, and the altar of incense,
na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya,
9 And the altar of burnt offering with all his furniture, and the laver and his foot,
na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
10 And the cloths of service, and the holy garments for Aaron the priest, and the garments of his sons, to minister in the priest’s office,
Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.
11 And the anointing oil, and sweet incense for the holy [place: ] according to all that I have commanded thee shall they do.
Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
12 And the LORD spake unto Moses, saying,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
13 Speak thou also unto the children of Israel, saying, Verily my sabbaths ye shall keep: for it [is] a sign between me and you throughout your generations; that [ye] may know that I [am] the LORD that doth sanctify you.
Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.
14 Ye shall keep the sabbath therefore; for it [is] holy unto you: every one that defileth it shall surely be put to death: for whosoever doeth [any] work therein, that soul shall be cut off from among his people.
“‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.
15 Six days may work be done; but in the seventh [is] the sabbath of rest, holy to the LORD: whosoever doeth [any] work in the sabbath day, he shall surely be put to death.
Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.
16 Wherefore the children of Israel shall keep the sabbath, to observe the sabbath throughout their generations, [for] a perpetual covenant.
Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.
17 It [is] a sign between me and the children of Israel for ever: for [in] six days the LORD made heaven and earth, and on the seventh day he rested, and was refreshed.
Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’”
18 And he gave unto Moses, when he had made an end of communing with him upon mount Sinai, two tables of testimony, tables of stone, written with the finger of God.
Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.

< Exodus 31 >