< Psalms 145 >

1 A Psalm of praise; of David. I will extol Thee, my God, O King; and I will bless Thy name for ever and ever.
Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
2 Every day will I bless Thee; and I will praise Thy name for ever and ever.
Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
3 Great is the LORD, and highly to be praised; and His greatness is unsearchable.
Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
4 One generation shall laud Thy works to another, and shall declare Thy mighty acts.
Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
5 The glorious splendour of Thy majesty, and Thy wondrous works, will I rehearse.
Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
6 And men shall speak of the might of Thy tremendous acts; and I will tell of Thy greatness.
Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
7 They shall utter the fame of Thy great goodness, and shall sing of Thy righteousness.
Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
8 The LORD is gracious, and full of compassion; slow to anger, and of great mercy.
Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
9 The LORD is good to all; and His tender mercies are over all His works.
Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
10 All Thy works shall praise Thee, O LORD; and Thy saints shall bless Thee.
O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
11 They shall speak of the glory of Thy kingdom, and talk of Thy might;
Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
12 To make known to the sons of men His mighty acts, and the glory of the majesty of His kingdom.
ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
13 Thy kingdom is a kingdom for all ages, and Thy dominion endureth throughout all generations.
Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
14 The LORD upholdeth all that fall, and raiseth up all those that are bowed down.
Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
15 The eyes of all wait for Thee, and Thou givest them their food in due season.
Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
16 Thou openest Thy hand, and satisfiest every living thing with favour.
I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
17 The LORD is righteous in all His ways, and gracious in all His works.
Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
18 The LORD is nigh unto all them that call upon Him, to all that call upon Him in truth.
Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
19 He will fulfil the desire of them that fear Him; He also will hear their cry, and will save them.
Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
20 The LORD preserveth all them that love Him; but all the wicked will He destroy.
Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
21 My mouth shall speak the praise of the LORD; and let all flesh bless His holy name for ever and ever.
Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.

< Psalms 145 >