< Nahum 1 >
1 THE BURDEN of Nineveh. The book of the vision of Nahum the Elkoshite.
Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
2 The LORD is a jealous and avenging God, the LORD avengeth and is full of wrath; the LORD taketh vengeance on His adversaries, and He reserveth wrath for His enemies.
Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
3 The LORD is long-suffering, and great in power, and will by no means clear the guilty; the LORD, in the whirlwind and in the storm is His way, and the clouds are the dust of His feet.
Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
4 He rebuketh the sea, and maketh it dry, and drieth up all the rivers; Bashan languisheth, and Carmel, and the flower of Lebanon languisheth.
Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
5 The mountains quake at Him, and the hills melt; and the earth is upheaved at His presence, yea, the world, and all that dwell therein.
Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
6 Who can stand before His indignation? And who can abide in the fierceness of His anger? His fury is poured out like fire, and the rocks are broken asunder before Him.
Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
7 The LORD is good, a stronghold in the day of trouble; and He knoweth them that take refuge in Him.
Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
8 But with an overrunning flood He will make a full end of the place thereof, and darkness shall pursue His enemies.
ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
9 What do ye devise against the LORD? He will make a full end; trouble shall not rise up the second time.
Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
10 For though they be like tangled thorns, and be drunken according to their drink, they shall be devoured as stubble fully dry.
Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
11 Out of thee came he forth, that deviseth evil against the LORD, that counselleth wickedness.
Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
12 Thus saith the LORD: Though they be in full strength, and likewise many, even so shall they be cut down, and he shall pass away; and though I have afflicted thee, I will afflict thee no more.
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
13 And now will I break his yoke from off thee, and will burst thy bonds in sunder.
Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”
14 And the LORD hath given commandment concerning thee, that no more of thy name be sown; out of the house of thy god will I cut off the graven image and the molten image; I will make thy grave; for thou art become worthless.
Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
15 Behold upon the mountains the feet of him that bringeth good tidings, that announceth peace! Keep thy feasts, O Judah, perform thy vows; for the wicked one shall no more pass through thee; he is utterly cut off.
Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.