< Genesis 11 >

1 And the whole earth was of one language and of one speech.
Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
2 And it came to pass, as they journeyed east, that they found a plain in the land of Shinar; and they dwelt there.
Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
3 And they said one to another: 'Come, let us make brick, and burn them thoroughly.' And they had brick for stone, and slime had they for mortar.
Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
4 And they said: 'Come, let us build us a city, and a tower, with its top in heaven, and let us make us a name; lest we be scattered abroad upon the face of the whole earth.'
Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
5 And the LORD came down to see the city and the tower, which the children of men builded.
Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
6 And the LORD said: 'Behold, they are one people, and they have all one language; and this is what they begin to do; and now nothing will be withholden from them, which they purpose to do.
Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
7 Come, let us go down, and there confound their language, that they may not understand one another's speech.'
Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
8 So the LORD scattered them abroad from thence upon the face of all the earth; and they left off to build the city.
Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
9 Therefore was the name of it called Babel; because the LORD did there confound the language of all the earth; and from thence did the LORD scatter them abroad upon the face of all the earth.
Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
10 These are the generations of Shem. Shem was a hundred years old, and begot Arpachshad two years after the flood.
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
11 And Shem lived after he begot Arpachshad five hundred years, and begot sons and daughters.
Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
12 And Arpachshad lived five and thirty years, and begot Shelah.
Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
13 And Arpachshad lived after he begot Shelah four hundred and three years, and begot sons and daughters.
Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14 And Shelah lived thirty years, and begot Eber.
Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba.
15 And Shelah lived after he begot Eber four hundred and three years, and begot sons and daughters.
Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
16 And Eber lived four and thirty years, and begot Peleg.
Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg.
17 And Eber lived after he begot Peleg four hundred and thirty years, and begot sons and daughters.
Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
18 And Peleg lived thirty years, and begot Reu.
Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
19 And Peleg lived after he begot Reu two hundred and nine years, and begot sons and daughters.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20 And Reu lived two and thirty years, and begot Serug.
Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
21 And Reu lived after he begot Serug two hundred and seven years, and begot sons and daughters.
Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
22 And Serug lived thirty years, and begot Nahor.
Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
23 And Serug lived after he begot Nahor two hundred years, and begot sons and daughters.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
24 And Nahor lived nine and twenty years, and begot Terah.
Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
25 And Nahor lived after he begot Terah a hundred and nineteen years, and begot sons and daughters.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
26 And Terah lived seventy years, and begot Abram, Nahor, and Haran.
Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
27 Now these are the generations of Terah. Terah begot Abram, Nahor, and Haran; and Haran begot Lot.
Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
28 And Haran died in the presence of his father Terah in the land of his nativity, in Ur of the Chaldees.
Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
29 And Abram and Nahor took them wives: the name of Abram's wife was Sarai; and the name of Nahor's wife, Milcah, the daughter of Haran, the father of Milcah, and the father of Iscah.
Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
30 And Sarai was barren; she had no child.
Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
31 And Terah took Abram his son, and Lot the son of Haran, his son's son, and Sarai his daughter-in-law, his son Abram's wife; and they went forth with them from Ur of the Chaldees, to go into the land of Canaan; and they came unto Haran, and dwelt there.
Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
32 And the days of Terah were two hundred and five years; and Terah died in Haran.
Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.

< Genesis 11 >