< Ezekiel 23 >

1 And the word of the LORD came unto me, saying:
Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị m,
2 'Son of man, there were two women, the daughters of one mother;
“Nwa nke mmadụ, ọ dị ndị inyom abụọ nke otu nne mụrụ.
3 and they committed harlotries in Egypt; they committed harlotries in their youth; there were their bosoms pressed, and there their virgin breasts were bruised.
Ha ghọrọ ndị akwụna nʼala Ijipt site na mgbe ha bụ agbọghọ. Nʼala ahụ, a bịagidere ara ha aka, pịakwa ọnụ ara agbọghọ ha aka nʼọnọdụ igwuri egwu.
4 And the names of them were Oholah the elder, and Oholibah her sister; and they became Mine, and they bore sons and daughters. And as for their names, Samaria is Oholah, and Jerusalem Oholibah.
Aha nke okenye bụ Ohola. Aha nwanne ya nwanyị bụ Oholiba. Ha bụrịị nkem, ha mụtakwara m ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị. Ohola bụ Sameria, Oholiba bụkwa Jerusalem.
5 And Oholah played the harlot when she was Mine; and she doted on her lovers, on the Assyrians, warriors,
“Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa,
6 clothed with blue, governors and rulers, handsome young men all of them, horsemen riding upon horses.
ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya.
7 And she bestowed her harlotries upon them, the choicest men of Assyria all of them; and on whomsoever she doted, with all their idols she defiled herself.
O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya.
8 Neither hath she left her harlotries brought from Egypt; for in her youth they lay with her, and they bruised her virgin breasts; and they poured out their lust upon her.
Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya.
9 Wherefore I delivered her into the hand of her lovers, into the hand of the Assyrians, upon whom she doted.
“Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.
10 These uncovered her nakedness; they took her sons and her daughters, and her they slew with the sword; and she became a byword among women, for judgments were executed upon her.
Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ.
11 And her sister Oholibah saw this, yet was she more corrupt in her doting than she, and in her harlotries more than her sister in her harlotries.
“Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.
12 She doted upon the Assyrians, governors and rulers, warriors, clothed most gorgeously, horsemen riding upon horses, all of them handsome young men.
Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.
13 And I saw that she was defiled; they both took one way.
Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.
14 And she increased her harlotries; for she saw men portrayed upon the wall, the images of the Chaldeans portrayed with vermilion,
“O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta,
15 girded with girdles upon their loins, with pendant turbans upon their heads, all of them captains to look upon, the likeness of the sons of Babylon, even of Chaldea, the land of their nativity.
ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
16 And as soon as she saw them she doted upon them, and sent messengers unto them into Chaldea.
Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.
17 And the Babylonians came to her into the bed of love, and they defiled her with their lust; and she was polluted with them, and her soul was alienated from them.
Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi.
18 So she uncovered her harlotries, and uncovered her nakedness; then My soul was alienated from her, like as My soul was alienated from her sister.
Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.
19 Yet she multiplied her harlotries, remembering the days of her youth, wherein she had played the harlot in the land of Egypt.
Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.
20 And she doted upon concubinage with them, whose flesh is as the flesh of asses, and whose issue is like the issue of horses.
Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.
21 Thus thou didst call to remembrance the lewdness of thy youth, when they from Egypt bruised thy breasts for the bosom of thy youth.
Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.
22 Therefore, O Oholibah, thus saith the Lord GOD: Behold, I will raise up thy lovers against thee, from whom thy soul is alienated, and I will bring them against thee on every side:
“Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.
23 the Babylonians and all the Chaldeans, Pekod and Shoa and Koa, and all the Assyrians with them, handsome young men, governors and rulers all of them, captains and councillors, all of them riding upon horses.
Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.
24 And they shall come against thee with hosts, chariots, and wheels, and with an assembly of peoples; they shall set themselves in array against thee with buckler and shield and helmet round about; and I will commit the judgment unto them, and they shall judge thee according to their judgments.
Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.
25 And I will set My jealousy against thee, and they shall deal with thee in fury; they shall take away thy nose and thine ears, and thy residue shall fall by the sword; they shall take thy sons and thy daughters, and thy residue shall be devoured by the fire.
Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa.
26 They shall also strip thee of thy clothes, and take away thy fair jewels.
Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
27 Thus will I make thy lewdness to cease from thee, and thy harlotry brought from the land of Egypt, so that thou shalt not lift up thine eyes unto them, nor remember Egypt any more.
Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.
28 For thus saith the Lord GOD: Behold, I will deliver thee into the hand of them whom thou hatest, into the hand of them from whom thy soul is alienated;
“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
29 and they shall deal with thee in hatred, and shall take away all thy labour, and shall leave thee naked and bare; and the nakedness of thy harlotries shall be uncovered, both thy lewdness and thy harlotries.
Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị
30 These things shall be done unto thee, for that thou hast gone astray after the nations, and because thou art polluted with their idols.
emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.
31 In the way of thy sister hast thou walked; therefore will I give her cup into thy hand.
Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.
32 Thus saith the Lord GOD: Thou shalt drink of thy sister's cup, which is deep and large; thou shalt be for a scorn and a derision; it is full to the uttermost.
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
33 Thou shalt be filled with drunkenness and sorrow, with the cup of astonishment and appalment, with the cup of thy sister Samaria.
Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ, nʼihi iko mbibi na ntikpọsi, bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
34 Thou shalt even drink it and drain it, and thou shalt craunch the sherds thereof, and shalt tear thy breasts; for I have spoken it, saith the Lord GOD.
Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
35 Therefore thus saith the Lord GOD: Because thou hast forgotten Me, and cast Me behind thy back, therefore bear thou also thy lewdness and thy harlotries.'
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
36 The LORD said moreover unto me: 'Son of man, wilt thou judge Oholah and Oholibah? then declare unto them their abominations.
Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
37 For they have committed adultery, and blood is in their hands, and with their idols have they committed adultery; and their sons, whom they bore unto Me, they have also set apart unto them to be devoured.
Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.
38 Moreover this they have done unto Me: they have defiled My sanctuary in the same day, and have profaned My sabbaths.
Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
39 For when they had slain their children to their idols, then they came the same day into My sanctuary to profane it; and, lo, thus have they done in the midst of My house.
Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.
40 And furthermore ye have sent for men that come from far; unto whom a messenger was sent, and, lo, they came; for whom thou didst wash thyself, paint thine eyes, and deck thyself with ornaments;
“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
41 and sattest upon a stately bed, with a table prepared before it, whereupon thou didst set Mine incense and Mine oil.
Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.
42 And the voice of a multitude being at ease was therein; and for the sake of men, they were so many, brought drunken from the wilderness, they put bracelets upon their hands, and beautiful crowns upon their heads.
“Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi.
43 Then said I of her that was worn out by adulteries: Still they commit harlotries with her, even her.
Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’
44 For every one went in unto her, as men go in unto a harlot; so went they in unto Oholah and unto Oholibah, the lewd women.
Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.
45 But righteous men, they shall judge them as adulteresses are judged, and as women that shed blood are judged; because they are adulteresses, and blood is in their hands.
Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
46 For thus saith the Lord GOD: An assembly shall be brought up against them, and they shall be made a horror and a spoil.
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
47 And the assembly shall stone them with stones, and despatch them with their swords; they shall slay their sons and their daughters, and burn up their houses with fire.
Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.
48 Thus will I cause lewdness to cease out of the land, that all women may be taught not to do after your lewdness.
“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
49 And your lewdness shall be recompensed upon you, and ye shall bear the sins of your idols; and ye shall know that I am the Lord GOD.'
Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”

< Ezekiel 23 >