< Exodus 40 >

1 Then the Lord spake vnto Moses, saying,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 In the first day of the first moneth in the very first of the same moneth shalt thou set vp the Tabernacle, called ye Tabernacle of the Congregation:
“Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ.
3 And thou shalt put therein the Arke of the Testimonie, and couer the Arke with the vaile.
Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.
4 Also thou shalt bring in the Table, and set it in order as it doth require: thou shalt also bring in the Candlesticke, and light his lampes,
Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.
5 And thou shalt set ye incense Altar of gold before the Arke of the Testimonie, and put the hanging at the doore of the Tabernacle.
Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
6 Moreouer, thou shalt set the burnt offering Altar before the doore of the Tabernacle, called the Tabernacle of the Congregation.
“Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.
7 And thou shalt set the Lauer betweene the Tabernacle of the Congregation and the Altar, and put water therein.
Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.
8 Then thou shalt appoynt the courte round about, and hang vp the hanging at the courte gate.
Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
9 After, thou shalt take the anoynting oyle, and anoynt the Tabernacle, and all that is therein, and halowe it with all the instruments thereof, that it may be holy.
“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.
10 And thou shalt anoynt the Altar of the burnt offring, and all his instruments, and shalt sanctifie the Altar, that it may bee an altar most holie.
Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
11 Also thou shalt anoynt the Lauer, and his foote, and shalt sanctifie it.
Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
12 Then thou shalt bring Aaron and his sonnes vnto the doore of the Tabernacle of the Congregation, and wash them with water.
“Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
13 And thou shalt put vpon Aaron the holy garmentes, and shalt anoynt him, and sanctifie him, that he may minister vnto me in the Priestes office.
Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
14 Thou shalt also bring his sonnes, and clothe them with garments,
Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.
15 And shalt anoynt them as thou diddest anoynt their father, that they may minister vnto mee in the Priestes office: for their anoynting shall be a signe, that the Priesthood shall be euerlasting vnto them throughout their generations.
Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
16 So Moses did according to all that ye Lord had commanded him: so did he.
Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.
17 Thus was the Tabernacle reared vp the first day of the first moneth in the seconde yeere.
O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.
18 Then Moses reared vp the Tabernacle and fastened his sockets, and set vp the boardes thereof, and put in the barres of it, and reared vp his pillars.
Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.
19 And he spred the couering ouer the Tabernacle, and put the couering of that couering on hie aboue it, as the Lord had commanded Moses.
Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.
20 And he tooke and put the Testimonie in the Arke, and put the barres in the ringes of the Arke, and set the Merciseate on hie vpon the Arke.
O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
21 He brought also the Arke into the Tabernacle, and hanged vp the couering vaile, and couered the Arke of the Testimonie, as the Lord had commanded Moses.
Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
22 Furthermore he put the Table in the Tabernacle of the Congregation in the Northside of the Tabernacle, without the vaile,
Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.
23 And set the bread in order before the Lord, as the Lord had commanded Moses.
Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
24 Also he put the Candlesticke in the Tabernacle of the Congregation, ouer against the Table toward ye Southside of the Tabernacle.
Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
25 And he lighted the lampes before the Lord, as the Lord had commanded Moses.
Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
26 Moreouer he set the golden Altar in the Tabernacle of the Congregation before the vayle,
Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị,
27 And burnt sweete incense thereon, as the Lord had commanded Moses.
surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
28 Also he hanged vp the vayle at the doore of the Tabernacle.
Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
29 After, he set the burnt offring Altar without the doore of the Tabernacle, called the Tabernacle of the Congregation, and offered the burnt offering and the sacrifice thereon, as the Lord had commanded Moses.
Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.
30 Likewise he set the Lauer betweene the Tabernacle of the Congregation and the Altar, and powred water therein to wash with.
Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe.
31 So Moses and Aaron, and his sonnes washed their handes and their feete thereat.
Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.
32 When they went into the Tabernacle of the Congregation, and when they approched to the Altar, they washed, as the Lord had commanded Moses.
Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
33 Finally, he reared vp the court rounde about the Tabernacle and the Altar, and hanged vp the vaile at the court gate: so Moses finished the worke.
Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.
34 Then the cloud couered the Tabernacle of the Congregation, and the glorie of the Lord filled the Tabernacle.
Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.
35 So Moses could not enter into the Tabernacle of the Congregation, because the cloude abode thereon, and the glorie of the Lord filled the Tabernacle.
Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
36 Nowe when the cloude ascended vp from the Tabernacle, the children of Israel went forward in all their iourneyes.
Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.
37 But if the cloude ascended not, then they iourneyed not till the day that it ascended.
Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.
38 For the cloude of the Lord was vpon the Tabernacle by day, and fire was in it by night in the sight of all the house of Israel, throughout all their iourneyes.
Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

< Exodus 40 >