< Psalms 133 >

1 A song for pilgrims going up to Jerusalem. A psalm of David. How good, how delightful it is when people live together lin harmony!
Abụ nrigo, nke Devid. Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
2 This is as precious as the oil used to anoint Aaron, running down from his head onto his beard, onto the collar of his clothes.
Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
3 It's like the dew of Mount Hermon that falls on Zion's mountains. That is where the Lord gave his blessing of life that lasts forever.
Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

< Psalms 133 >