< Psalms 102 >

1 A prayer from someone who is suffering and is tired out, pouring out their troubles to the Lord. Lord please hear my prayer, my cry for help!
Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
2 Don't hide your face from me in my time of trouble! Turn and listen to me, and answer me quickly when I call.
Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.
3 My life is disappearing like smoke; my body feels like it's on fire!
Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
4 I'm like grass that's dried up, withered away—I even forget to eat!
Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.
5 All my groaning has worn me out; my bones show through my skin.
Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
6 I'm like a desert owl, like a little owl among the ruins.
Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
7 I can't sleep. I'm like a lonely bird on a rooftop.
Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
8 My enemies taunt me all day long. They mock me and swear at me.
Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
9 Ashes are the food I eat; my tears drip into my drink,
Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
10 because of your anger and hostility, for you have picked me up and tossed me away.
nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
11 My life is fading away like a shadow that lengthens—I'm withering away like grass.
Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.
12 But you, Lord, reign forever, your fame will last for all generations.
Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
13 You will take action and have pity on Jerusalem, for it's time to be kind to the city, the time has come.
Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.
14 For the people who follow you love its stones; they value even its dust!
Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
15 Then the nations will be in awe of who you are, Lord; all the kings of the earth will be in awe of your glory.
Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
16 For the Lord will rebuild Jerusalem; he will appear in glory.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
17 He will pay attention to the prayers of the homeless; he will not disregard their requests.
Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.
18 Let this be recorded for generations to come, so that people yet to be born may praise the Lord:
Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
19 The Lord looked down from above, from the heights of his holy place; he looked down from heaven to the earth,
“Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
20 to respond to the groans of prisoners, to set free the children of death.
ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
21 As a result the wonderful nature of the Lord will be celebrated with praise in Jerusalem,
Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,
22 when the people of many kingdoms gather together to worship the Lord.
mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.
23 But as for me, he broke my health while I was still young, cutting my life short.
O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
24 I cried out, “My God, don't take my life while I'm young! You are the one who lives forever.
Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
25 Long ago you created the earth; you made the heavens.
Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
26 They will come to an end, but you will not. They will all wear out, like clothes—you will change them, and throw them away.
Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
27 But you are the one who always is; your years never come to an end.
Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
28 Our children will live with you, and our children's children will grow in your presence.”
Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”

< Psalms 102 >