< Numbers 27 >

1 The daughters of Zelophehad came to present their case. Their father Zelophehad was the son of Hepher, son of Gilead, son of Machir, son of Manasseh, and was from the tribe of Manasseh, son of Joseph. The names of his daughters were Mahlah, Noah, Hoglah, Milcah, and Tirzah. They came
Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,
2 and stood before Moses, Eleazar the priest, the leaders, and all the Israelites at the entrance to the Tent of Meeting. They said,
nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
3 “Our father died in the desert, but he wasn't one of Korah's followers who joined together to rebel against the Lord. No, he died from his own sins, and he didn't have any sons.
“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
4 Why should our family name be lost simply because he didn't have a son? Give us land to own alongside our uncles.”
Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
5 Moses took their case before the Lord.
Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
6 The Lord gave him this answer,
Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
7 “What the daughters of Zelophehad are saying is right. You really must give them land to own alongside their uncles—give to them what would have been allocated to their father.
“Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
8 In addition, tell the Israelites, ‘If a man dies and doesn't have a no son, give his property to his daughter.
“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
9 If he doesn't have a daughter, give his property to his brothers.
Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
10 If he doesn't have brothers, give his property to his father's brothers.
A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.
11 If his father doesn't have brothers, give his property his family's next of kin so that they can own it. This is a legal regulation for the Israelites, given as an order by the Lord to Moses.’”
Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’”
12 The Lord told Moses, “Go up into the Abarim mountains so you can see the land that I have given the Israelites.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
13 After you have seen it, you will also join your forefathers in death, just as your brother Aaron did,
Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
14 because when the Israelites complained in the Desert of Zin, you both rebelled against my instructions to show my holiness before them in regard to providing water.” (These were the waters of Meribah in Kadesh, in the Desert of Zin.)
Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15 Then Moses pleaded with the Lord,
Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
16 “May the Lord, the God who gives life to all living beings, choose a man to lead the Israelites
“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
17 who will tell them what to do and show them where to go, so that the people of the Lord won't be like sheep without a shepherd.”
Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18 The Lord told Moses, “Call for Joshua, son of Nun, a man who has the Spirit in him, and place your hands on him.
Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
19 Make him stand in front of Eleazar the priest and all the Israelites, and dedicate him while they watch.
Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
20 Hand over some of your authority to him so that all the Israelites will obey him.
Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
21 When he needs instructions he is to go before Eleazar the priest who will ask the Lord on his behalf and find out the decision using the Urim. Joshua will give orders to all the Israelites concerning everything they are to do.”
Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
22 Moses followed the Lord's instructions. He had Joshua come and stand in front of Eleazar the priest and all the Israelites.
Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
23 Moses placed his hands on Joshua and dedicated him, just as the Lord had told him to do.
Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

< Numbers 27 >